Jeremaya 50:31
Jeremiah 50:31 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Lee, edoola m onwe m imegide gị, gị onye nganga.” Otu a ka Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya. “Nʼihi na ụbọchị gị abịala, bụ oge ahụ a ga-ata gị ahụhụ.
Jeremiah 50:31 in English
Jeremiah 50:31 · Berean Standard Bible
“Behold, I am against you, O arrogant one,” declares the Lord GOD of Hosts, “for your day has come, the time when I will punish you.
Context
29“Kpọkọtanụ ndị na-agba ụta maka imegide Babilọn,
bụ ndị niile na-agba ụta.
Maanụ ụlọ ikwu, gbaa ya gburugburu;
unu ekwela ka onye ọbụla si nʼime ya gbapụ.
Kwụghachi ya ụgwọ dịka ọrụ ya si dị,
dịka ihe niile ahụ o mere si dị meenụ ya otu ahụ.
Nʼihi na o buliela onwe ya elu megide Onyenwe anyị,
bụ Onye nsọ nke Izrel. 30Nʼihi ya, ụmụ okorobịa ya ga-ada nʼokporoụzọ ama niile.
A ga-emekwa ka ndị agha ya niile dere duu nʼụbọchị ahụ.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 31“Lee, edoola m onwe m imegide gị, gị onye nganga.”
Otu a ka Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya.
“Nʼihi na ụbọchị gị abịala,
bụ oge ahụ a ga-ata gị ahụhụ. 32Onye nganga ahụ ga-asọ ngọngọ daa,
ma o nweghị onye ga-enyere ya aka ka o bilitekwa.
Aga m esunye obodo ya niile ọkụ,
nke ga-erechapụ ndị niile gbara ya gburugburu.” 33Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru:
“A na-emegbu nnọọ ndị Izrel,
nʼotu aka ahụkwa, ndị Juda.
Ndị dọtara ha nʼagha jidesiri ha aka ike.
Ha adịghị ahapụ ha ka ha laa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.