Jeremaya 50:30
Jeremiah 50:30 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi ya, ụmụ okorobịa ya ga-ada nʼokporoụzọ ama niile. A ga-emekwa ka ndị agha ya niile dere duu nʼụbọchị ahụ.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
Jeremiah 50:30 in English
Jeremiah 50:30 · Berean Standard Bible
Therefore, her young men will fall in the streets, and all her warriors will be silenced in that day,” declares the LORD.
Context
28Geenụ ntị nʼihe ndị na-agbalaga na-ekwu, bụ ndị si na Babilọn na-agbapụ ọsọ.
Ha na-ekwusa na Zayọn
otu Onyenwe anyị Chineke anyị si bọọ ọbọ,
otu o si abọ ọbọ nʼihi ụlọnsọ ukwu ya. 29“Kpọkọtanụ ndị na-agba ụta maka imegide Babilọn,
bụ ndị niile na-agba ụta.
Maanụ ụlọ ikwu, gbaa ya gburugburu;
unu ekwela ka onye ọbụla si nʼime ya gbapụ.
Kwụghachi ya ụgwọ dịka ọrụ ya si dị,
dịka ihe niile ahụ o mere si dị meenụ ya otu ahụ.
Nʼihi na o buliela onwe ya elu megide Onyenwe anyị,
bụ Onye nsọ nke Izrel. 30Nʼihi ya, ụmụ okorobịa ya ga-ada nʼokporoụzọ ama niile.
A ga-emekwa ka ndị agha ya niile dere duu nʼụbọchị ahụ.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 31“Lee, edoola m onwe m imegide gị, gị onye nganga.”
Otu a ka Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya.
“Nʼihi na ụbọchị gị abịala,
bụ oge ahụ a ga-ata gị ahụhụ. 32Onye nganga ahụ ga-asọ ngọngọ daa,
ma o nweghị onye ga-enyere ya aka ka o bilitekwa.
Aga m esunye obodo ya niile ọkụ,
nke ga-erechapụ ndị niile gbara ya gburugburu.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.