Native Bible

Jeremiah 50:35 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Mma agha ga-ebili megide ndị Babilọn niile,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “na ndị ahụ niile bi na Babilọn ma megidekwa ndịisi ọchịchị niile na ndị ahụ niile maara ihe.

Jeremiah 50:35 in English

Jeremiah 50:35 · Berean Standard Bible

A sword is against the Chaldeans, declares the LORD, against those who live in Babylon, and against her officials and wise men.

Context

33Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru: “A na-emegbu nnọọ ndị Izrel, nʼotu aka ahụkwa, ndị Juda. Ndị dọtara ha nʼagha jidesiri ha aka ike. Ha adịghị ahapụ ha ka ha laa. 34Ma Onye mgbapụta ha dị ike. Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụkwa aha ya. Ọ ga-eji ike ya niile kpepụta ọnụ ha, ime ka ala ha nweekwa izuike, ma meekwa ka ndị bi na Babilọn ghara inwe izuike. 35“Mma agha ga-ebili megide ndị Babilọn niile,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “na ndị ahụ niile bi na Babilọn ma megidekwa ndịisi ọchịchị niile na ndị ahụ niile maara ihe. 36Mma agha ga-ebili megide ndị amụma ụgha ha niile. Ha ga-aghọ ndị nzuzu. Mma agha ga-ebili megide ndị bụ dike nʼagha. Obi ha ga-ejupụtakwa nʼoke egwu. 37Mma agha ga-ebili megide ịnyịnya ha, na ụgbọ agha ha, na ndị mba ọzọ niile nọ nʼetiti ha. Ha ga-aghọkwa ndị inyom. Mma agha ga-ebilikwa megide akụ ha niile. A ga-alụta ha niile nʼagha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.