Jeremaya 50:37
Jeremiah 50:37 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mma agha ga-ebili megide ịnyịnya ha, na ụgbọ agha ha, na ndị mba ọzọ niile nọ nʼetiti ha. Ha ga-aghọkwa ndị inyom. Mma agha ga-ebilikwa megide akụ ha niile. A ga-alụta ha niile nʼagha.
Jeremiah 50:37 in English
Jeremiah 50:37 · Berean Standard Bible
A sword is against her horses and chariots and against all the foreigners in her midst, and they will become like women. A sword is against her treasuries, and they will be plundered.
Context
35“Mma agha ga-ebili megide ndị Babilọn niile,”
otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,
“na ndị ahụ niile bi na Babilọn
ma megidekwa ndịisi ọchịchị niile na ndị ahụ niile maara ihe. 36Mma agha ga-ebili megide ndị amụma ụgha ha niile.
Ha ga-aghọ ndị nzuzu.
Mma agha ga-ebili megide ndị bụ dike nʼagha.
Obi ha ga-ejupụtakwa nʼoke egwu. 37Mma agha ga-ebili megide ịnyịnya ha, na ụgbọ agha ha,
na ndị mba ọzọ niile nọ nʼetiti ha.
Ha ga-aghọkwa ndị inyom.
Mma agha ga-ebilikwa megide akụ ha niile.
A ga-alụta ha niile nʼagha. 38Okpomọkụ ga-abịakwasị mmiri ha niile
mee ka ha taa.
Nʼihi na ala ha bụ ala arụsị:
arụsị ha niile ga-ayịkwa ara nʼihi oke egwu nke ga-abịakwasị ha. 39“Nʼihi ya, ọ bụ ụmụ anụmanụ nke ọzara, na nkịta ọhịa ga-ebi nʼebe ahụ.
Ikwighịkwighị ga-ebikwa nʼebe ahụ.
Mmadụ ọbụla agaghị ebikwa nʼime ya ọzọ.
O nweghị onye ga-ebikwa nʼime ya site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.