Jeremaya 48:7
Jeremiah 48:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ebe ọ bụ na unu na-atụkwasị obi nʼaka ọrụ unu, na nʼakụnụba unu, a ga-adọtakwa unu nʼagha. Ndị Kemosh ka a ga-eburu gaa mba ọzọ, ha na ndị nchụaja na ndịisi ọchịchị ya.
Jeremiah 48:7 in English
Jeremiah 48:7 · Berean Standard Bible
Because you trust in your works and treasures, you too will be captured, and Chemosh will go into exile with his priests and officials.
Context
5Ha ga-eji oke ịkwa akwa
na-agbago ụzọ Luhit;
a ga-anụkwa mkpu akwa nke ndị e bibiri ihe ha nʼụzọ na-agbada Horonaim.
A ga-anụ akwa mwute nʼihi mbibi nke bịakwasịrị ha. 6Gbalaganụ! Gbapụnụ ọsọ ndụ!
Dịkwanụ ka osisi nta nke dị nʼọzara. 7Ebe ọ bụ na unu na-atụkwasị obi nʼaka ọrụ unu, na nʼakụnụba unu,
a ga-adọtakwa unu nʼagha.
Ndị Kemosh ka a ga-eburu gaa mba ọzọ,
ha na ndị nchụaja na ndịisi ọchịchị ya. 8Onye mbibi ahụ ga-abịa megide obodo niile.
O nwekwaghị obodo nke pụrụ ịgbanarị mbibi ya.
A ga-ala ndagwurugwu niile nʼiyi,
bibiekwa ebe dị elu nke dị larịị,
nʼihi na ọ bụ okwu si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta. 9Wụkwasị ala Moab nnu,
nʼihi na a ga-eme ka ọ ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu.
Obodo niile dị nʼime ya ga-aghọ mkpọmkpọ ebe,
nke mmadụ ọbụla na-agaghị ebikwa nʼime ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.