Jeremaya 48:8
Jeremiah 48:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye mbibi ahụ ga-abịa megide obodo niile. O nwekwaghị obodo nke pụrụ ịgbanarị mbibi ya. A ga-ala ndagwurugwu niile nʼiyi, bibiekwa ebe dị elu nke dị larịị, nʼihi na ọ bụ okwu si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta.
Jeremiah 48:8 in English
Jeremiah 48:8 · Berean Standard Bible
The destroyer will move against every city, and not one town will escape. The valley will also be ruined, and the high plain will be destroyed, as the LORD has said.
Context
6Gbalaganụ! Gbapụnụ ọsọ ndụ!
Dịkwanụ ka osisi nta nke dị nʼọzara. 7Ebe ọ bụ na unu na-atụkwasị obi nʼaka ọrụ unu, na nʼakụnụba unu,
a ga-adọtakwa unu nʼagha.
Ndị Kemosh ka a ga-eburu gaa mba ọzọ,
ha na ndị nchụaja na ndịisi ọchịchị ya. 8Onye mbibi ahụ ga-abịa megide obodo niile.
O nwekwaghị obodo nke pụrụ ịgbanarị mbibi ya.
A ga-ala ndagwurugwu niile nʼiyi,
bibiekwa ebe dị elu nke dị larịị,
nʼihi na ọ bụ okwu si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta. 9Wụkwasị ala Moab nnu,
nʼihi na a ga-eme ka ọ ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu.
Obodo niile dị nʼime ya ga-aghọ mkpọmkpọ ebe,
nke mmadụ ọbụla na-agaghị ebikwa nʼime ya. 10“Ọbụbụ ọnụ dịrị onye ahụ ji aghụghọ na-arụ ọrụ Onyenwe anyị.
Ahụhụ dịrị onye na-ewezuga mma agha nʼebe iwusi ọbara dị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.