Native Bible

Jeremiah 48:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Gbalaganụ! Gbapụnụ ọsọ ndụ! Dịkwanụ ka osisi nta nke dị nʼọzara.

Jeremiah 48:6 in English

Jeremiah 48:6 · Berean Standard Bible

‘Flee! Run for your lives! Become like a juniper in the desert.*’

Context

4A ga-etikpọ Moab, ụmụntakịrị ya ga-etikwa mkpu akwa. 5Ha ga-eji oke ịkwa akwa na-agbago ụzọ Luhit; a ga-anụkwa mkpu akwa nke ndị e bibiri ihe ha nʼụzọ na-agbada Horonaim. A ga-anụ akwa mwute nʼihi mbibi nke bịakwasịrị ha. 6Gbalaganụ! Gbapụnụ ọsọ ndụ! Dịkwanụ ka osisi nta nke dị nʼọzara. 7Ebe ọ bụ na unu na-atụkwasị obi nʼaka ọrụ unu, na nʼakụnụba unu, a ga-adọtakwa unu nʼagha. Ndị Kemosh ka a ga-eburu gaa mba ọzọ, ha na ndị nchụaja na ndịisi ọchịchị ya. 8Onye mbibi ahụ ga-abịa megide obodo niile. O nwekwaghị obodo nke pụrụ ịgbanarị mbibi ya. A ga-ala ndagwurugwu niile nʼiyi, bibiekwa ebe dị elu nke dị larịị, nʼihi na ọ bụ okwu si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.