Jeremaya 48:4
Jeremiah 48:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
A ga-etikpọ Moab, ụmụntakịrị ya ga-etikwa mkpu akwa.
Jeremiah 48:4 in English
Jeremiah 48:4 · Berean Standard Bible
Moab will be shattered; her little ones will cry out.*
Context
2Ọ dịkwaghị ndị ga-eto Moab ọzọ,
kama a ga-anọ na Heshbọn pịa ọpịpịa ọdịda ya.
Ha ga-asị, ‘Bịanụ ka anyị bibie mba a, ka ọ ghara ịdịkwa.’
Ọ bụladị gị bụ Madmen, ka a ga-eme ka i dere duu.
A ga-ejikwa mma agha chụọ gị ọsọ. 3Gee ntị nụrụ akwa na-ada na Horonaim,
ọ bụ mkpu akwa oke mbibi na ịla nʼiyi. 4A ga-etikpọ Moab,
ụmụntakịrị ya ga-etikwa mkpu akwa. 5Ha ga-eji oke ịkwa akwa
na-agbago ụzọ Luhit;
a ga-anụkwa mkpu akwa nke ndị e bibiri ihe ha nʼụzọ na-agbada Horonaim.
A ga-anụ akwa mwute nʼihi mbibi nke bịakwasịrị ha. 6Gbalaganụ! Gbapụnụ ọsọ ndụ!
Dịkwanụ ka osisi nta nke dị nʼọzara.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.