Jeremaya 48:3
Jeremiah 48:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gee ntị nụrụ akwa na-ada na Horonaim, ọ bụ mkpu akwa oke mbibi na ịla nʼiyi.
Jeremiah 48:3 in English
Jeremiah 48:3 · Berean Standard Bible
A voice cries out from Horonaim: ‘Devastation and great destruction!’
Context
1Nke a dịrị Moab:
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru,
“Ahụhụ dịrị Nebo! Nʼihi na a ga-emebi ya.
A ga-emekwa ka ihere mee Kiriatem, e, a ga-adọta ya nʼagha.
A ga-etipịa Misgab, mee ka ihere mee ya. 2Ọ dịkwaghị ndị ga-eto Moab ọzọ,
kama a ga-anọ na Heshbọn pịa ọpịpịa ọdịda ya.
Ha ga-asị, ‘Bịanụ ka anyị bibie mba a, ka ọ ghara ịdịkwa.’
Ọ bụladị gị bụ Madmen, ka a ga-eme ka i dere duu.
A ga-ejikwa mma agha chụọ gị ọsọ. 3Gee ntị nụrụ akwa na-ada na Horonaim,
ọ bụ mkpu akwa oke mbibi na ịla nʼiyi. 4A ga-etikpọ Moab,
ụmụntakịrị ya ga-etikwa mkpu akwa. 5Ha ga-eji oke ịkwa akwa
na-agbago ụzọ Luhit;
a ga-anụkwa mkpu akwa nke ndị e bibiri ihe ha nʼụzọ na-agbada Horonaim.
A ga-anụ akwa mwute nʼihi mbibi nke bịakwasịrị ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.