Jeremaya 48:1
Jeremiah 48:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nke a dịrị Moab: Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, “Ahụhụ dịrị Nebo! Nʼihi na a ga-emebi ya. A ga-emekwa ka ihere mee Kiriatem, e, a ga-adọta ya nʼagha. A ga-etipịa Misgab, mee ka ihere mee ya.
Jeremiah 48:1 in English
Jeremiah 48:1 · Berean Standard Bible
Concerning Moab, this is what the LORD of Hosts, the God of Israel, says: “Woe to Nebo, for it will be devastated. Kiriathaim will be captured and disgraced; the fortress will be shattered and dismantled.
Context
1Nke a dịrị Moab:
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru,
“Ahụhụ dịrị Nebo! Nʼihi na a ga-emebi ya.
A ga-emekwa ka ihere mee Kiriatem, e, a ga-adọta ya nʼagha.
A ga-etipịa Misgab, mee ka ihere mee ya. 2Ọ dịkwaghị ndị ga-eto Moab ọzọ,
kama a ga-anọ na Heshbọn pịa ọpịpịa ọdịda ya.
Ha ga-asị, ‘Bịanụ ka anyị bibie mba a, ka ọ ghara ịdịkwa.’
Ọ bụladị gị bụ Madmen, ka a ga-eme ka i dere duu.
A ga-ejikwa mma agha chụọ gị ọsọ. 3Gee ntị nụrụ akwa na-ada na Horonaim,
ọ bụ mkpu akwa oke mbibi na ịla nʼiyi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.