Jeremaya 48:5
Jeremiah 48:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha ga-eji oke ịkwa akwa na-agbago ụzọ Luhit; a ga-anụkwa mkpu akwa nke ndị e bibiri ihe ha nʼụzọ na-agbada Horonaim. A ga-anụ akwa mwute nʼihi mbibi nke bịakwasịrị ha.
Jeremiah 48:5 in English
Jeremiah 48:5 · Berean Standard Bible
For on the ascent to Luhith they weep bitterly as they go, and on the descent to Horonaim cries of distress resound over the destruction:
Context
3Gee ntị nụrụ akwa na-ada na Horonaim,
ọ bụ mkpu akwa oke mbibi na ịla nʼiyi. 4A ga-etikpọ Moab,
ụmụntakịrị ya ga-etikwa mkpu akwa. 5Ha ga-eji oke ịkwa akwa
na-agbago ụzọ Luhit;
a ga-anụkwa mkpu akwa nke ndị e bibiri ihe ha nʼụzọ na-agbada Horonaim.
A ga-anụ akwa mwute nʼihi mbibi nke bịakwasịrị ha. 6Gbalaganụ! Gbapụnụ ọsọ ndụ!
Dịkwanụ ka osisi nta nke dị nʼọzara. 7Ebe ọ bụ na unu na-atụkwasị obi nʼaka ọrụ unu, na nʼakụnụba unu,
a ga-adọtakwa unu nʼagha.
Ndị Kemosh ka a ga-eburu gaa mba ọzọ,
ha na ndị nchụaja na ndịisi ọchịchị ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.