Jeremaya 48:9
Jeremiah 48:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Wụkwasị ala Moab nnu, nʼihi na a ga-eme ka ọ ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu. Obodo niile dị nʼime ya ga-aghọ mkpọmkpọ ebe, nke mmadụ ọbụla na-agaghị ebikwa nʼime ya.
Jeremiah 48:9 in English
Jeremiah 48:9 · Berean Standard Bible
Put salt on Moab, for she will be laid waste;* her cities will become desolate, with no one to dwell in them.
Context
7Ebe ọ bụ na unu na-atụkwasị obi nʼaka ọrụ unu, na nʼakụnụba unu,
a ga-adọtakwa unu nʼagha.
Ndị Kemosh ka a ga-eburu gaa mba ọzọ,
ha na ndị nchụaja na ndịisi ọchịchị ya. 8Onye mbibi ahụ ga-abịa megide obodo niile.
O nwekwaghị obodo nke pụrụ ịgbanarị mbibi ya.
A ga-ala ndagwurugwu niile nʼiyi,
bibiekwa ebe dị elu nke dị larịị,
nʼihi na ọ bụ okwu si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta. 9Wụkwasị ala Moab nnu,
nʼihi na a ga-eme ka ọ ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu.
Obodo niile dị nʼime ya ga-aghọ mkpọmkpọ ebe,
nke mmadụ ọbụla na-agaghị ebikwa nʼime ya. 10“Ọbụbụ ọnụ dịrị onye ahụ ji aghụghọ na-arụ ọrụ Onyenwe anyị.
Ahụhụ dịrị onye na-ewezuga mma agha nʼebe iwusi ọbara dị. 11“Onye na-anọ juu ka Moab bụ site na mgbe ọ bụ nwantakịrị,
ọ dịka mmanya doro edo,
nke a na-adịghị esi nʼotu udu wụgharịa ya nʼime udu ọzọ,
o nwebeghị oge ọbụla e ji mee ka ọ ga biri nʼala ọzọ.
Ọ bụ ya mere ụtọ ya adịghị agbanwe agbanwe,
isisi ya agbanwekwaghị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.