Native Bible

Jeremiah 48:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ọbụbụ ọnụ dịrị onye ahụ ji aghụghọ na-arụ ọrụ Onyenwe anyị. Ahụhụ dịrị onye na-ewezuga mma agha nʼebe iwusi ọbara dị.

Jeremiah 48:10 in English

Jeremiah 48:10 · Berean Standard Bible

Cursed is the one who is remiss in doing the work of the LORD, and cursed is he who withholds his sword from bloodshed.

Context

8Onye mbibi ahụ ga-abịa megide obodo niile. O nwekwaghị obodo nke pụrụ ịgbanarị mbibi ya. A ga-ala ndagwurugwu niile nʼiyi, bibiekwa ebe dị elu nke dị larịị, nʼihi na ọ bụ okwu si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta. 9Wụkwasị ala Moab nnu, nʼihi na a ga-eme ka ọ ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu. Obodo niile dị nʼime ya ga-aghọ mkpọmkpọ ebe, nke mmadụ ọbụla na-agaghị ebikwa nʼime ya. 10“Ọbụbụ ọnụ dịrị onye ahụ ji aghụghọ na-arụ ọrụ Onyenwe anyị. Ahụhụ dịrị onye na-ewezuga mma agha nʼebe iwusi ọbara dị. 11“Onye na-anọ juu ka Moab bụ site na mgbe ọ bụ nwantakịrị, ọ dịka mmanya doro edo, nke a na-adịghị esi nʼotu udu wụgharịa ya nʼime udu ọzọ, o nwebeghị oge ọbụla e ji mee ka ọ ga biri nʼala ọzọ. Ọ bụ ya mere ụtọ ya adịghị agbanwe agbanwe, isisi ya agbanwekwaghị. 12Ma ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-eziga ndị ikom ọrụ ha bụ ịwụpụ ihe site nʼite,* ha ga-awụpụkwa ya. Ha ga-agbapụ ihe niile dị nʼite ya niile, tụwakwaa ite ya niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.