Native Bible

Jeremiah 48:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-eziga ndị ikom ọrụ ha bụ ịwụpụ ihe site nʼite,* ha ga-awụpụkwa ya. Ha ga-agbapụ ihe niile dị nʼite ya niile, tụwakwaa ite ya niile.

Jeremiah 48:12 in English

Jeremiah 48:12 · Berean Standard Bible

Therefore behold, the days are coming, declares the LORD, when I will send to him wanderers, who will pour him out. They will empty his vessels and shatter his jars.

Context

10“Ọbụbụ ọnụ dịrị onye ahụ ji aghụghọ na-arụ ọrụ Onyenwe anyị. Ahụhụ dịrị onye na-ewezuga mma agha nʼebe iwusi ọbara dị. 11“Onye na-anọ juu ka Moab bụ site na mgbe ọ bụ nwantakịrị, ọ dịka mmanya doro edo, nke a na-adịghị esi nʼotu udu wụgharịa ya nʼime udu ọzọ, o nwebeghị oge ọbụla e ji mee ka ọ ga biri nʼala ọzọ. Ọ bụ ya mere ụtọ ya adịghị agbanwe agbanwe, isisi ya agbanwekwaghị. 12Ma ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-eziga ndị ikom ọrụ ha bụ ịwụpụ ihe site nʼite,* ha ga-awụpụkwa ya. Ha ga-agbapụ ihe niile dị nʼite ya niile, tụwakwaa ite ya niile. 13Mgbe ahụ, ihere Kemosh ga-eme Moab, dịka ihere si mee Izrel mgbe ha tụkwasịrị Betel obi ha. 14“Unu si aṅaa ekwu sị, ‘Ndị dị ike nʼagha ka anyị bụ; anyị bụkwa dimkpa nʼagha’?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.