Jeremaya 48:12
Jeremiah 48:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-eziga ndị ikom ọrụ ha bụ ịwụpụ ihe site nʼite,* ha ga-awụpụkwa ya. Ha ga-agbapụ ihe niile dị nʼite ya niile, tụwakwaa ite ya niile.
Jeremiah 48:12 in English
Jeremiah 48:12 · Berean Standard Bible
Therefore behold, the days are coming, declares the LORD, when I will send to him wanderers, who will pour him out. They will empty his vessels and shatter his jars.
Context
10“Ọbụbụ ọnụ dịrị onye ahụ ji aghụghọ na-arụ ọrụ Onyenwe anyị.
Ahụhụ dịrị onye na-ewezuga mma agha nʼebe iwusi ọbara dị. 11“Onye na-anọ juu ka Moab bụ site na mgbe ọ bụ nwantakịrị,
ọ dịka mmanya doro edo,
nke a na-adịghị esi nʼotu udu wụgharịa ya nʼime udu ọzọ,
o nwebeghị oge ọbụla e ji mee ka ọ ga biri nʼala ọzọ.
Ọ bụ ya mere ụtọ ya adịghị agbanwe agbanwe,
isisi ya agbanwekwaghị. 12Ma ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,
“mgbe m ga-eziga ndị ikom ọrụ ha bụ ịwụpụ ihe site nʼite,*
ha ga-awụpụkwa ya.
Ha ga-agbapụ ihe niile dị nʼite ya niile,
tụwakwaa ite ya niile. 13Mgbe ahụ, ihere Kemosh ga-eme Moab,
dịka ihere si mee Izrel
mgbe ha tụkwasịrị Betel obi ha. 14“Unu si aṅaa ekwu sị, ‘Ndị dị ike nʼagha ka anyị bụ;
anyị bụkwa dimkpa nʼagha’?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.