Jeremaya 30:17
Jeremiah 30:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma aga m eme ka ahụ sie gị ike; aga m agwọkwa ọnya gị niile,’ otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. ‘Nʼihi na a na-akpọ gị onye a jụrụ ajụ. Gị Zayọn, nke o nweghị onye na-elekọta ya.’
Jeremiah 30:17 in English
Jeremiah 30:17 · Berean Standard Bible
But I will restore your health and heal your wounds, declares the LORD, because they call you an outcast, Zion, for whom no one cares.”
Context
15Gịnị mere i ji na-akwa akwa nʼihi ọnya dị gị nʼahụ?
Gịnị mere i ji na-akwa akwa nʼihi ihe mgbu nke na-enweghị ọgwụgwọ?
Emere m ka ihe ndị a bịakwasị gị nʼihi ịba ụba nke ajọ omume gị,
na nʼihi ọtụtụ mmehie gị. 16“ ‘Ma a ga-erepịa ndị niile na-eripịa gị;
ndị iro gị niile, ha niile nʼotu nʼotu, ka a ga-adọta nʼagha buru gaa mba ọzọ.
Ndị na-apụnara gị ihe i nwere nʼike ka a ga-apụnarakwa ha ihe ha nwere nʼike.
Ndị niile na-alụtakwa ihe inwere nʼagha ka a ga-enye ka ha ghọọ ihe nlụta nʼagha. 17Ma aga m eme ka ahụ sie gị ike;
aga m agwọkwa ọnya gị niile,’ otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
‘Nʼihi na a na-akpọ gị onye a jụrụ ajụ.
Gị Zayọn, nke o nweghị onye na-elekọta ya.’ 18“Otu a ka Onyenwe anyị kwuru,
“ ‘Lee, ana m aga ime ka Jekọb nwetaghachi ụlọ ikwu* ya;
aga m enwekwa obi ebere nʼebe obibi ya.
A ga-ewugharị obodo ahụ nʼelu mkpọmkpọ ebe ya;*
ụlọeze ga-eguzokwa nʼọnọdụ kwesiri ya. 19Nʼebe ahụ ka a ga-esi na-anụ olu abụ ekele,
na olu ndị na-aṅụrị ọṅụ.
Aga m eme ka ha baa ụba nʼọnụọgụgụ,
ha agaghị adịkwa ole na ole.
Aga m eme ka ha bụrụ ndị a na-asọpụrụ,
ndị a na-agaghị eledakwa anya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.