Native Bible

Jeremiah 30:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “ ‘Lee, ana m aga ime ka Jekọb nwetaghachi ụlọ ikwu* ya; aga m enwekwa obi ebere nʼebe obibi ya. A ga-ewugharị obodo ahụ nʼelu mkpọmkpọ ebe ya;* ụlọeze ga-eguzokwa nʼọnọdụ kwesiri ya.

Jeremiah 30:18 in English

Jeremiah 30:18 · Berean Standard Bible

This is what the LORD says: “I will restore the fortunes of * Jacob’s tents and have compassion on his dwellings. And the city will be rebuilt on her own ruins, and the palace will stand in its rightful place.

Context

16“ ‘Ma a ga-erepịa ndị niile na-eripịa gị; ndị iro gị niile, ha niile nʼotu nʼotu, ka a ga-adọta nʼagha buru gaa mba ọzọ. Ndị na-apụnara gị ihe i nwere nʼike ka a ga-apụnarakwa ha ihe ha nwere nʼike. Ndị niile na-alụtakwa ihe inwere nʼagha ka a ga-enye ka ha ghọọ ihe nlụta nʼagha. 17Ma aga m eme ka ahụ sie gị ike; aga m agwọkwa ọnya gị niile,’ otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. ‘Nʼihi na a na-akpọ gị onye a jụrụ ajụ. Gị Zayọn, nke o nweghị onye na-elekọta ya.’ 18“Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “ ‘Lee, ana m aga ime ka Jekọb nwetaghachi ụlọ ikwu* ya; aga m enwekwa obi ebere nʼebe obibi ya. A ga-ewugharị obodo ahụ nʼelu mkpọmkpọ ebe ya;* ụlọeze ga-eguzokwa nʼọnọdụ kwesiri ya. 19Nʼebe ahụ ka a ga-esi na-anụ olu abụ ekele, na olu ndị na-aṅụrị ọṅụ. Aga m eme ka ha baa ụba nʼọnụọgụgụ, ha agaghị adịkwa ole na ole. Aga m eme ka ha bụrụ ndị a na-asọpụrụ, ndị a na-agaghị eledakwa anya. 20Ụmụ ha ga-adịkwa ka ụmụntakịrị ndị mgbe ochie ahụ, nzukọ ha ga-eguzosikwa ike nʼihu m. Aga m atakwa ndị ahụ na-emegbu ha ahụhụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.