Jeremaya 30:20
Jeremiah 30:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụmụ ha ga-adịkwa ka ụmụntakịrị ndị mgbe ochie ahụ, nzukọ ha ga-eguzosikwa ike nʼihu m. Aga m atakwa ndị ahụ na-emegbu ha ahụhụ.
Jeremiah 30:20 in English
Jeremiah 30:20 · Berean Standard Bible
Their children will be as in days of old, and their congregation will be established before Me; and I will punish all their oppressors.
Context
18“Otu a ka Onyenwe anyị kwuru,
“ ‘Lee, ana m aga ime ka Jekọb nwetaghachi ụlọ ikwu* ya;
aga m enwekwa obi ebere nʼebe obibi ya.
A ga-ewugharị obodo ahụ nʼelu mkpọmkpọ ebe ya;*
ụlọeze ga-eguzokwa nʼọnọdụ kwesiri ya. 19Nʼebe ahụ ka a ga-esi na-anụ olu abụ ekele,
na olu ndị na-aṅụrị ọṅụ.
Aga m eme ka ha baa ụba nʼọnụọgụgụ,
ha agaghị adịkwa ole na ole.
Aga m eme ka ha bụrụ ndị a na-asọpụrụ,
ndị a na-agaghị eledakwa anya. 20Ụmụ ha ga-adịkwa ka ụmụntakịrị ndị mgbe ochie ahụ,
nzukọ ha ga-eguzosikwa ike nʼihu m.
Aga m atakwa ndị ahụ na-emegbu ha ahụhụ. 21Onyendu ha ga-abụ otu onye nʼime ndị ha;
onye ga-achị ha ga-esi nʼetiti ha pụta.
Aga m akpọbata ya nso ebe m nọ, ọ ga-abịaru m nso,
nʼihi na olee mmadụ ahụ nke pụrụ inyefe onwe ya kpamkpam,
maka ịbịaru m nso?’
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 22‘Nʼụzọ dị otu a unu ga-abụ ndị m,
mụ onwe m kwa ga-abụ Chineke unu.’ ”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.