Native Bible

Jeremiah 30:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

‘Nʼụzọ dị otu a unu ga-abụ ndị m, mụ onwe m kwa ga-abụ Chineke unu.’ ”

Jeremiah 30:22 in English

Jeremiah 30:22 · Berean Standard Bible

“And you will be My people, and I will be your God.”

Context

20Ụmụ ha ga-adịkwa ka ụmụntakịrị ndị mgbe ochie ahụ, nzukọ ha ga-eguzosikwa ike nʼihu m. Aga m atakwa ndị ahụ na-emegbu ha ahụhụ. 21Onyendu ha ga-abụ otu onye nʼime ndị ha; onye ga-achị ha ga-esi nʼetiti ha pụta. Aga m akpọbata ya nso ebe m nọ, ọ ga-abịaru m nso, nʼihi na olee mmadụ ahụ nke pụrụ inyefe onwe ya kpamkpam, maka ịbịaru m nso?’ Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 22‘Nʼụzọ dị otu a unu ga-abụ ndị m, mụ onwe m kwa ga-abụ Chineke unu.’ ” 23Lee, Onyenwe anyị ga-esite nʼọnụma ya mee ka oke ifufe ya fee. Ọ ga-efekwasị ndị na-emebi iwu dịka ifufe na-efesi ike. 24Iwe ọkụ Onyenwe anyị agaghị akwụsị tutu ruo mgbe o mezuru ihe ndị o bu nʼobi. Nʼụbọchị ndị ahụ na-abịa unu ga-aghọta ihe ndị a. 30:10 Ya bụ, adakwala mba 30:11 Dịka o ziri ezi nʼikpe 30:18 Ya bụ, ebe obibi 30:18 Ụfọdụ akwụkwọ na-asị nʼelu ugwu ya

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.