Native Bible

Jeremiah 30:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onyendu ha ga-abụ otu onye nʼime ndị ha; onye ga-achị ha ga-esi nʼetiti ha pụta. Aga m akpọbata ya nso ebe m nọ, ọ ga-abịaru m nso, nʼihi na olee mmadụ ahụ nke pụrụ inyefe onwe ya kpamkpam, maka ịbịaru m nso?’ Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

Jeremiah 30:21 in English

Jeremiah 30:21 · Berean Standard Bible

Their leader will be one of their own, and their ruler will arise from their midst. And I will bring him near, and he will approach Me, for who would dare on his own to approach Me?” declares the LORD.

Context

19Nʼebe ahụ ka a ga-esi na-anụ olu abụ ekele, na olu ndị na-aṅụrị ọṅụ. Aga m eme ka ha baa ụba nʼọnụọgụgụ, ha agaghị adịkwa ole na ole. Aga m eme ka ha bụrụ ndị a na-asọpụrụ, ndị a na-agaghị eledakwa anya. 20Ụmụ ha ga-adịkwa ka ụmụntakịrị ndị mgbe ochie ahụ, nzukọ ha ga-eguzosikwa ike nʼihu m. Aga m atakwa ndị ahụ na-emegbu ha ahụhụ. 21Onyendu ha ga-abụ otu onye nʼime ndị ha; onye ga-achị ha ga-esi nʼetiti ha pụta. Aga m akpọbata ya nso ebe m nọ, ọ ga-abịaru m nso, nʼihi na olee mmadụ ahụ nke pụrụ inyefe onwe ya kpamkpam, maka ịbịaru m nso?’ Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 22‘Nʼụzọ dị otu a unu ga-abụ ndị m, mụ onwe m kwa ga-abụ Chineke unu.’ ” 23Lee, Onyenwe anyị ga-esite nʼọnụma ya mee ka oke ifufe ya fee. Ọ ga-efekwasị ndị na-emebi iwu dịka ifufe na-efesi ike.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.