Jeremaya 30:19
Jeremiah 30:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼebe ahụ ka a ga-esi na-anụ olu abụ ekele, na olu ndị na-aṅụrị ọṅụ. Aga m eme ka ha baa ụba nʼọnụọgụgụ, ha agaghị adịkwa ole na ole. Aga m eme ka ha bụrụ ndị a na-asọpụrụ, ndị a na-agaghị eledakwa anya.
Jeremiah 30:19 in English
Jeremiah 30:19 · Berean Standard Bible
Thanksgiving will proceed from them, a sound of celebration. I will multiply them, and they will not be decreased; I will honor them, and they will not be belittled.
Context
17Ma aga m eme ka ahụ sie gị ike;
aga m agwọkwa ọnya gị niile,’ otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
‘Nʼihi na a na-akpọ gị onye a jụrụ ajụ.
Gị Zayọn, nke o nweghị onye na-elekọta ya.’ 18“Otu a ka Onyenwe anyị kwuru,
“ ‘Lee, ana m aga ime ka Jekọb nwetaghachi ụlọ ikwu* ya;
aga m enwekwa obi ebere nʼebe obibi ya.
A ga-ewugharị obodo ahụ nʼelu mkpọmkpọ ebe ya;*
ụlọeze ga-eguzokwa nʼọnọdụ kwesiri ya. 19Nʼebe ahụ ka a ga-esi na-anụ olu abụ ekele,
na olu ndị na-aṅụrị ọṅụ.
Aga m eme ka ha baa ụba nʼọnụọgụgụ,
ha agaghị adịkwa ole na ole.
Aga m eme ka ha bụrụ ndị a na-asọpụrụ,
ndị a na-agaghị eledakwa anya. 20Ụmụ ha ga-adịkwa ka ụmụntakịrị ndị mgbe ochie ahụ,
nzukọ ha ga-eguzosikwa ike nʼihu m.
Aga m atakwa ndị ahụ na-emegbu ha ahụhụ. 21Onyendu ha ga-abụ otu onye nʼime ndị ha;
onye ga-achị ha ga-esi nʼetiti ha pụta.
Aga m akpọbata ya nso ebe m nọ, ọ ga-abịaru m nso,
nʼihi na olee mmadụ ahụ nke pụrụ inyefe onwe ya kpamkpam,
maka ịbịaru m nso?’
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.