Jeremaya 30:16
Jeremiah 30:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“ ‘Ma a ga-erepịa ndị niile na-eripịa gị; ndị iro gị niile, ha niile nʼotu nʼotu, ka a ga-adọta nʼagha buru gaa mba ọzọ. Ndị na-apụnara gị ihe i nwere nʼike ka a ga-apụnarakwa ha ihe ha nwere nʼike. Ndị niile na-alụtakwa ihe inwere nʼagha ka a ga-enye ka ha ghọọ ihe nlụta nʼagha.
Jeremiah 30:16 in English
Jeremiah 30:16 · Berean Standard Bible
Nevertheless, all who devour you will be devoured, and all your adversaries—every one of them— will go off into exile. Those who plundered you will be plundered, and all who raided you will be raided.
Context
14Ndị niile gị na ha dị na mma e chezọọla gị;
ha adịghị echetakwa gị nʼechiche uche ha.
E tieela m gị ihe dịka onye iro gị ga-esi tie gị ihe;
ataala m gị ahụhụ dịka onye na-enweghị obi ebere ga-esi taa gị ahụhụ,
nʼihi na ajọ omume gị bara ụba nke ukwuu,
mmehie gị dịkwa ọtụtụ. 15Gịnị mere i ji na-akwa akwa nʼihi ọnya dị gị nʼahụ?
Gịnị mere i ji na-akwa akwa nʼihi ihe mgbu nke na-enweghị ọgwụgwọ?
Emere m ka ihe ndị a bịakwasị gị nʼihi ịba ụba nke ajọ omume gị,
na nʼihi ọtụtụ mmehie gị. 16“ ‘Ma a ga-erepịa ndị niile na-eripịa gị;
ndị iro gị niile, ha niile nʼotu nʼotu, ka a ga-adọta nʼagha buru gaa mba ọzọ.
Ndị na-apụnara gị ihe i nwere nʼike ka a ga-apụnarakwa ha ihe ha nwere nʼike.
Ndị niile na-alụtakwa ihe inwere nʼagha ka a ga-enye ka ha ghọọ ihe nlụta nʼagha. 17Ma aga m eme ka ahụ sie gị ike;
aga m agwọkwa ọnya gị niile,’ otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
‘Nʼihi na a na-akpọ gị onye a jụrụ ajụ.
Gị Zayọn, nke o nweghị onye na-elekọta ya.’ 18“Otu a ka Onyenwe anyị kwuru,
“ ‘Lee, ana m aga ime ka Jekọb nwetaghachi ụlọ ikwu* ya;
aga m enwekwa obi ebere nʼebe obibi ya.
A ga-ewugharị obodo ahụ nʼelu mkpọmkpọ ebe ya;*
ụlọeze ga-eguzokwa nʼọnọdụ kwesiri ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.