Jeremaya 30:14
Jeremiah 30:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị niile gị na ha dị na mma e chezọọla gị; ha adịghị echetakwa gị nʼechiche uche ha. E tieela m gị ihe dịka onye iro gị ga-esi tie gị ihe; ataala m gị ahụhụ dịka onye na-enweghị obi ebere ga-esi taa gị ahụhụ, nʼihi na ajọ omume gị bara ụba nke ukwuu, mmehie gị dịkwa ọtụtụ.
Jeremiah 30:14 in English
Jeremiah 30:14 · Berean Standard Bible
All your lovers have forgotten you; they no longer seek you, for I have struck you as an enemy would, with the discipline of someone cruel, because of your great iniquity and your numerous sins.
Context
12“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwukwara,
“ ‘Ọnya dị gị nʼahụ enweghị ngwọta,
mmerụ ahụ i merụrụ dị ukwuu, ọ pụghị ịla ala. 13O nweghị onye na-ekpechitere gị ọnụ gị,
o nweghị ọgwụ dị nke e ji eme ka ọnya gị laa.
Olileanya adịghị na a ga-agwọ gị. 14Ndị niile gị na ha dị na mma e chezọọla gị;
ha adịghị echetakwa gị nʼechiche uche ha.
E tieela m gị ihe dịka onye iro gị ga-esi tie gị ihe;
ataala m gị ahụhụ dịka onye na-enweghị obi ebere ga-esi taa gị ahụhụ,
nʼihi na ajọ omume gị bara ụba nke ukwuu,
mmehie gị dịkwa ọtụtụ. 15Gịnị mere i ji na-akwa akwa nʼihi ọnya dị gị nʼahụ?
Gịnị mere i ji na-akwa akwa nʼihi ihe mgbu nke na-enweghị ọgwụgwọ?
Emere m ka ihe ndị a bịakwasị gị nʼihi ịba ụba nke ajọ omume gị,
na nʼihi ọtụtụ mmehie gị. 16“ ‘Ma a ga-erepịa ndị niile na-eripịa gị;
ndị iro gị niile, ha niile nʼotu nʼotu, ka a ga-adọta nʼagha buru gaa mba ọzọ.
Ndị na-apụnara gị ihe i nwere nʼike ka a ga-apụnarakwa ha ihe ha nwere nʼike.
Ndị niile na-alụtakwa ihe inwere nʼagha ka a ga-enye ka ha ghọọ ihe nlụta nʼagha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.