Jeremaya 30:15
Jeremiah 30:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gịnị mere i ji na-akwa akwa nʼihi ọnya dị gị nʼahụ? Gịnị mere i ji na-akwa akwa nʼihi ihe mgbu nke na-enweghị ọgwụgwọ? Emere m ka ihe ndị a bịakwasị gị nʼihi ịba ụba nke ajọ omume gị, na nʼihi ọtụtụ mmehie gị.
Jeremiah 30:15 in English
Jeremiah 30:15 · Berean Standard Bible
Why do you cry out over your wound? Your pain has no cure! Because of your great iniquity and your numerous sins I have done these things to you.
Context
13O nweghị onye na-ekpechitere gị ọnụ gị,
o nweghị ọgwụ dị nke e ji eme ka ọnya gị laa.
Olileanya adịghị na a ga-agwọ gị. 14Ndị niile gị na ha dị na mma e chezọọla gị;
ha adịghị echetakwa gị nʼechiche uche ha.
E tieela m gị ihe dịka onye iro gị ga-esi tie gị ihe;
ataala m gị ahụhụ dịka onye na-enweghị obi ebere ga-esi taa gị ahụhụ,
nʼihi na ajọ omume gị bara ụba nke ukwuu,
mmehie gị dịkwa ọtụtụ. 15Gịnị mere i ji na-akwa akwa nʼihi ọnya dị gị nʼahụ?
Gịnị mere i ji na-akwa akwa nʼihi ihe mgbu nke na-enweghị ọgwụgwọ?
Emere m ka ihe ndị a bịakwasị gị nʼihi ịba ụba nke ajọ omume gị,
na nʼihi ọtụtụ mmehie gị. 16“ ‘Ma a ga-erepịa ndị niile na-eripịa gị;
ndị iro gị niile, ha niile nʼotu nʼotu, ka a ga-adọta nʼagha buru gaa mba ọzọ.
Ndị na-apụnara gị ihe i nwere nʼike ka a ga-apụnarakwa ha ihe ha nwere nʼike.
Ndị niile na-alụtakwa ihe inwere nʼagha ka a ga-enye ka ha ghọọ ihe nlụta nʼagha. 17Ma aga m eme ka ahụ sie gị ike;
aga m agwọkwa ọnya gị niile,’ otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
‘Nʼihi na a na-akpọ gị onye a jụrụ ajụ.
Gị Zayọn, nke o nweghị onye na-elekọta ya.’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.