Jeremaya 30:13
Jeremiah 30:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O nweghị onye na-ekpechitere gị ọnụ gị, o nweghị ọgwụ dị nke e ji eme ka ọnya gị laa. Olileanya adịghị na a ga-agwọ gị.
Jeremiah 30:13 in English
Jeremiah 30:13 · Berean Standard Bible
There is no one to plead your cause, no remedy for your sores, no recovery for you.
Context
11Nʼihi na mụ onwe m nọnyeere gị, aga m azọpụtakwa gị,’
otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
‘A sịkwarị na m alaa mba ndị ahụ niile nʼiyi,
bụ mba ndị ahụ m chụbanyere gị nʼime ha,
agaghị m ebibi gị onwe gị kpamkpam.
Aga m adọ gị aka na ntị maọbụ dịka o kwesiri,*
ị gaghị agbanarị ịta ahụhụ.’ 12“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwukwara,
“ ‘Ọnya dị gị nʼahụ enweghị ngwọta,
mmerụ ahụ i merụrụ dị ukwuu, ọ pụghị ịla ala. 13O nweghị onye na-ekpechitere gị ọnụ gị,
o nweghị ọgwụ dị nke e ji eme ka ọnya gị laa.
Olileanya adịghị na a ga-agwọ gị. 14Ndị niile gị na ha dị na mma e chezọọla gị;
ha adịghị echetakwa gị nʼechiche uche ha.
E tieela m gị ihe dịka onye iro gị ga-esi tie gị ihe;
ataala m gị ahụhụ dịka onye na-enweghị obi ebere ga-esi taa gị ahụhụ,
nʼihi na ajọ omume gị bara ụba nke ukwuu,
mmehie gị dịkwa ọtụtụ. 15Gịnị mere i ji na-akwa akwa nʼihi ọnya dị gị nʼahụ?
Gịnị mere i ji na-akwa akwa nʼihi ihe mgbu nke na-enweghị ọgwụgwọ?
Emere m ka ihe ndị a bịakwasị gị nʼihi ịba ụba nke ajọ omume gị,
na nʼihi ọtụtụ mmehie gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.