Native Bible

Jeremiah 30:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na mụ onwe m nọnyeere gị, aga m azọpụtakwa gị,’ otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. ‘A sịkwarị na m alaa mba ndị ahụ niile nʼiyi, bụ mba ndị ahụ m chụbanyere gị nʼime ha, agaghị m ebibi gị onwe gị kpamkpam. Aga m adọ gị aka na ntị maọbụ dịka o kwesiri,* ị gaghị agbanarị ịta ahụhụ.’

Jeremiah 30:11 in English

Jeremiah 30:11 · Berean Standard Bible

For I am with you to save you, declares the LORD. Though I will completely destroy all the nations to which I have scattered you, I will not completely destroy you. Yet I will discipline you justly, and will by no means leave you unpunished.”

Context

9Kama ha ga-efe Onyenwe anyị bụ Chineke ha, na Devid eze ha, onye m ga-esi nʼetiti ha mee ka o biliere ha. 10“ ‘Ya mere, atụla egwu, gị Jekọb, ohu m. Atụkwala ụjọ* gị Izrel,’ Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. ‘Aghaghị m ịzọpụta gị site na mba ahụ dị anya, zọpụtakwa ụmụ ụmụ gị site na mba ahụ e mere ka ha gaa biri nʼime ya. Jekọb ga-emesịakwa biri nʼudo na nchebe. Ọ dịkwaghị onye ga-eme ka ụjọ tụọ ya ọzọ. 11Nʼihi na mụ onwe m nọnyeere gị, aga m azọpụtakwa gị,’ otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. ‘A sịkwarị na m alaa mba ndị ahụ niile nʼiyi, bụ mba ndị ahụ m chụbanyere gị nʼime ha, agaghị m ebibi gị onwe gị kpamkpam. Aga m adọ gị aka na ntị maọbụ dịka o kwesiri,* ị gaghị agbanarị ịta ahụhụ.’ 12“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwukwara, “ ‘Ọnya dị gị nʼahụ enweghị ngwọta, mmerụ ahụ i merụrụ dị ukwuu, ọ pụghị ịla ala. 13O nweghị onye na-ekpechitere gị ọnụ gị, o nweghị ọgwụ dị nke e ji eme ka ọnya gị laa. Olileanya adịghị na a ga-agwọ gị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.