Jeremaya 30:11
Jeremiah 30:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na mụ onwe m nọnyeere gị, aga m azọpụtakwa gị,’ otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. ‘A sịkwarị na m alaa mba ndị ahụ niile nʼiyi, bụ mba ndị ahụ m chụbanyere gị nʼime ha, agaghị m ebibi gị onwe gị kpamkpam. Aga m adọ gị aka na ntị maọbụ dịka o kwesiri,* ị gaghị agbanarị ịta ahụhụ.’
Jeremiah 30:11 in English
Jeremiah 30:11 · Berean Standard Bible
For I am with you to save you, declares the LORD. Though I will completely destroy all the nations to which I have scattered you, I will not completely destroy you. Yet I will discipline you justly, and will by no means leave you unpunished.”
Context
9Kama ha ga-efe Onyenwe anyị bụ Chineke ha,
na Devid eze ha,
onye m ga-esi nʼetiti ha mee ka o biliere ha. 10“ ‘Ya mere, atụla egwu, gị Jekọb, ohu m.
Atụkwala ụjọ* gị Izrel,’
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
‘Aghaghị m ịzọpụta gị site na mba ahụ dị anya,
zọpụtakwa ụmụ ụmụ gị site na mba ahụ e mere ka ha gaa biri nʼime ya.
Jekọb ga-emesịakwa biri nʼudo na nchebe.
Ọ dịkwaghị onye ga-eme ka ụjọ tụọ ya ọzọ. 11Nʼihi na mụ onwe m nọnyeere gị, aga m azọpụtakwa gị,’
otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
‘A sịkwarị na m alaa mba ndị ahụ niile nʼiyi,
bụ mba ndị ahụ m chụbanyere gị nʼime ha,
agaghị m ebibi gị onwe gị kpamkpam.
Aga m adọ gị aka na ntị maọbụ dịka o kwesiri,*
ị gaghị agbanarị ịta ahụhụ.’ 12“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwukwara,
“ ‘Ọnya dị gị nʼahụ enweghị ngwọta,
mmerụ ahụ i merụrụ dị ukwuu, ọ pụghị ịla ala. 13O nweghị onye na-ekpechitere gị ọnụ gị,
o nweghị ọgwụ dị nke e ji eme ka ọnya gị laa.
Olileanya adịghị na a ga-agwọ gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.