Jeremaya 30:10
Jeremiah 30:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“ ‘Ya mere, atụla egwu, gị Jekọb, ohu m. Atụkwala ụjọ* gị Izrel,’ Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. ‘Aghaghị m ịzọpụta gị site na mba ahụ dị anya, zọpụtakwa ụmụ ụmụ gị site na mba ahụ e mere ka ha gaa biri nʼime ya. Jekọb ga-emesịakwa biri nʼudo na nchebe. Ọ dịkwaghị onye ga-eme ka ụjọ tụọ ya ọzọ.
Jeremiah 30:10 in English
Jeremiah 30:10 · Berean Standard Bible
As for you, O Jacob My servant, do not be afraid, declares the LORD, and do not be dismayed, O Israel. For I will surely save you out of a distant place, your descendants from the land of their captivity! Jacob will return to quiet and ease, with no one to make him afraid.
Context
8“ ‘Nʼụbọchị ahụ,’
‘aga m agbaji ihe ịnya nʼolu a nyakwasịrị ha nʼolu,
tibisikwaa agbụ niile e kere ha.
Ha agaghị abụkwa ndị ohu nye ndị mba ọzọ, ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri. 9Kama ha ga-efe Onyenwe anyị bụ Chineke ha,
na Devid eze ha,
onye m ga-esi nʼetiti ha mee ka o biliere ha. 10“ ‘Ya mere, atụla egwu, gị Jekọb, ohu m.
Atụkwala ụjọ* gị Izrel,’
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
‘Aghaghị m ịzọpụta gị site na mba ahụ dị anya,
zọpụtakwa ụmụ ụmụ gị site na mba ahụ e mere ka ha gaa biri nʼime ya.
Jekọb ga-emesịakwa biri nʼudo na nchebe.
Ọ dịkwaghị onye ga-eme ka ụjọ tụọ ya ọzọ. 11Nʼihi na mụ onwe m nọnyeere gị, aga m azọpụtakwa gị,’
otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
‘A sịkwarị na m alaa mba ndị ahụ niile nʼiyi,
bụ mba ndị ahụ m chụbanyere gị nʼime ha,
agaghị m ebibi gị onwe gị kpamkpam.
Aga m adọ gị aka na ntị maọbụ dịka o kwesiri,*
ị gaghị agbanarị ịta ahụhụ.’ 12“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwukwara,
“ ‘Ọnya dị gị nʼahụ enweghị ngwọta,
mmerụ ahụ i merụrụ dị ukwuu, ọ pụghị ịla ala.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.