Jeremaya 30:8
Jeremiah 30:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“ ‘Nʼụbọchị ahụ,’ ‘aga m agbaji ihe ịnya nʼolu a nyakwasịrị ha nʼolu, tibisikwaa agbụ niile e kere ha. Ha agaghị abụkwa ndị ohu nye ndị mba ọzọ, ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.
Jeremiah 30:8 in English
Jeremiah 30:8 · Berean Standard Bible
On that day, declares the LORD of Hosts, I will break the yoke off their necks and tear off their bonds, and no longer will strangers enslave them.
Context
6Jụọnụ ajụjụ, ma hụ,
nwoke ọ pụrụ ịmụ ụmụ?
Gịnịkwa mere m ji na-ahụ ndị ikom dị ike
ka ha tụkwasịrị aka ha nʼukwu ha dịka nwanyị ime na-eme,
ihu onye ọbụla gbanwekwara dịka nke onye na-anwụ anwụ? 7Ụbọchị dị oke egwu ka ụbọchị ahụ ga-abụ.
O nwekwaghị ụbọchị ga-adị ka ya.
Ọ ga-abụ oge oke nsogbu nye Jekọb,
ma a ga-anapụta ya site na ya. 8“ ‘Nʼụbọchị ahụ,’
‘aga m agbaji ihe ịnya nʼolu a nyakwasịrị ha nʼolu,
tibisikwaa agbụ niile e kere ha.
Ha agaghị abụkwa ndị ohu nye ndị mba ọzọ, ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri. 9Kama ha ga-efe Onyenwe anyị bụ Chineke ha,
na Devid eze ha,
onye m ga-esi nʼetiti ha mee ka o biliere ha. 10“ ‘Ya mere, atụla egwu, gị Jekọb, ohu m.
Atụkwala ụjọ* gị Izrel,’
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
‘Aghaghị m ịzọpụta gị site na mba ahụ dị anya,
zọpụtakwa ụmụ ụmụ gị site na mba ahụ e mere ka ha gaa biri nʼime ya.
Jekọb ga-emesịakwa biri nʼudo na nchebe.
Ọ dịkwaghị onye ga-eme ka ụjọ tụọ ya ọzọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.