Native Bible

Jeremiah 30:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Kama ha ga-efe Onyenwe anyị bụ Chineke ha, na Devid eze ha, onye m ga-esi nʼetiti ha mee ka o biliere ha.

Jeremiah 30:9 in English

Jeremiah 30:9 · Berean Standard Bible

Instead, they will serve the LORD their God and David their king, whom I will raise up for them.

Context

7Ụbọchị dị oke egwu ka ụbọchị ahụ ga-abụ. O nwekwaghị ụbọchị ga-adị ka ya. Ọ ga-abụ oge oke nsogbu nye Jekọb, ma a ga-anapụta ya site na ya. 8“ ‘Nʼụbọchị ahụ,’ ‘aga m agbaji ihe ịnya nʼolu a nyakwasịrị ha nʼolu, tibisikwaa agbụ niile e kere ha. Ha agaghị abụkwa ndị ohu nye ndị mba ọzọ, ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri. 9Kama ha ga-efe Onyenwe anyị bụ Chineke ha, na Devid eze ha, onye m ga-esi nʼetiti ha mee ka o biliere ha. 10“ ‘Ya mere, atụla egwu, gị Jekọb, ohu m. Atụkwala ụjọ* gị Izrel,’ Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. ‘Aghaghị m ịzọpụta gị site na mba ahụ dị anya, zọpụtakwa ụmụ ụmụ gị site na mba ahụ e mere ka ha gaa biri nʼime ya. Jekọb ga-emesịakwa biri nʼudo na nchebe. Ọ dịkwaghị onye ga-eme ka ụjọ tụọ ya ọzọ. 11Nʼihi na mụ onwe m nọnyeere gị, aga m azọpụtakwa gị,’ otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. ‘A sịkwarị na m alaa mba ndị ahụ niile nʼiyi, bụ mba ndị ahụ m chụbanyere gị nʼime ha, agaghị m ebibi gị onwe gị kpamkpam. Aga m adọ gị aka na ntị maọbụ dịka o kwesiri,* ị gaghị agbanarị ịta ahụhụ.’

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.