Jeremaya 30:9
Jeremiah 30:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Kama ha ga-efe Onyenwe anyị bụ Chineke ha, na Devid eze ha, onye m ga-esi nʼetiti ha mee ka o biliere ha.
Jeremiah 30:9 in English
Jeremiah 30:9 · Berean Standard Bible
Instead, they will serve the LORD their God and David their king, whom I will raise up for them.
Context
7Ụbọchị dị oke egwu ka ụbọchị ahụ ga-abụ.
O nwekwaghị ụbọchị ga-adị ka ya.
Ọ ga-abụ oge oke nsogbu nye Jekọb,
ma a ga-anapụta ya site na ya. 8“ ‘Nʼụbọchị ahụ,’
‘aga m agbaji ihe ịnya nʼolu a nyakwasịrị ha nʼolu,
tibisikwaa agbụ niile e kere ha.
Ha agaghị abụkwa ndị ohu nye ndị mba ọzọ, ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri. 9Kama ha ga-efe Onyenwe anyị bụ Chineke ha,
na Devid eze ha,
onye m ga-esi nʼetiti ha mee ka o biliere ha. 10“ ‘Ya mere, atụla egwu, gị Jekọb, ohu m.
Atụkwala ụjọ* gị Izrel,’
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
‘Aghaghị m ịzọpụta gị site na mba ahụ dị anya,
zọpụtakwa ụmụ ụmụ gị site na mba ahụ e mere ka ha gaa biri nʼime ya.
Jekọb ga-emesịakwa biri nʼudo na nchebe.
Ọ dịkwaghị onye ga-eme ka ụjọ tụọ ya ọzọ. 11Nʼihi na mụ onwe m nọnyeere gị, aga m azọpụtakwa gị,’
otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
‘A sịkwarị na m alaa mba ndị ahụ niile nʼiyi,
bụ mba ndị ahụ m chụbanyere gị nʼime ha,
agaghị m ebibi gị onwe gị kpamkpam.
Aga m adọ gị aka na ntị maọbụ dịka o kwesiri,*
ị gaghị agbanarị ịta ahụhụ.’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.