Jeremaya 20:14
Jeremiah 20:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe a bụrụ ọnụ ka ụbọchị ahụ a mụrụ m bụ. Ka ụbọchị nne m mụrụ m ghara inwe ngọzị.
Jeremiah 20:14 in English
Jeremiah 20:14 · Berean Standard Bible
Cursed be the day I was born! May the day my mother bore me never be blessed.
Context
12Ma gị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, gị, onye na-enyocha onye ezi omume,
onye anya ya na-eru nʼihe dị mmadụ nʼobi na nʼime echiche uche ya,
biko, kwere ka m dị ndụ hụ mgbe ị ga-abọrọ onwe gị ọbọ megide ha,
nʼihi na ọ bụ nʼaka gị ka m tinyere ihe niile gbasara m. 13Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ!
Nyenụ Onyenwe anyị otuto!
Nʼihi na ọ na-anapụta ndụ ndị mkpa na-akpa,
site nʼaka ndị ajọ omume. 14Ihe a bụrụ ọnụ ka ụbọchị ahụ a mụrụ m bụ.
Ka ụbọchị nne m mụrụ m ghara inwe ngọzị. 15Onye a na-abụ ọnụ ka nwoke ahụ bụ nke wetara nna m akụkọ ọmụmụ m,
nke mere ka ọ ṅụrịa ọṅụ, na-asị ya,
“A mụọlara gị nwa, ọ bụ nwa nwoke!” 16Ka e meekwa nwoke ahụ ihe Onyenwe anyị mere obodo ndị ahụ
o bibiri na-enweghị ọmịiko.
Ka nwoke ahụ nọgidekwa na-anụ iti mkpu akwa nʼụtụtụ,
na akwa ibu agha nʼehihie.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.