Jeremaya 20:13
Jeremiah 20:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ! Nyenụ Onyenwe anyị otuto! Nʼihi na ọ na-anapụta ndụ ndị mkpa na-akpa, site nʼaka ndị ajọ omume.
Jeremiah 20:13 in English
Jeremiah 20:13 · Berean Standard Bible
Sing to the LORD! Praise the LORD! For He rescues the life of the needy from the hands of evildoers.
Context
11Ma Onyenwe anyị nọnyeere m dịka dike nʼagha;
nʼihi ya, ndị na-esogbu m ga-asọ ngọngọ, ha agaghị emerikwa m.
Ihe ha zubere agaghị emezuru ha, nʼihi ya, ihere ga-eme ha nke ukwuu;
a gaghị echezọkwa ọnọdụ ihere ha ruo ebighị ebi. 12Ma gị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, gị, onye na-enyocha onye ezi omume,
onye anya ya na-eru nʼihe dị mmadụ nʼobi na nʼime echiche uche ya,
biko, kwere ka m dị ndụ hụ mgbe ị ga-abọrọ onwe gị ọbọ megide ha,
nʼihi na ọ bụ nʼaka gị ka m tinyere ihe niile gbasara m. 13Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ!
Nyenụ Onyenwe anyị otuto!
Nʼihi na ọ na-anapụta ndụ ndị mkpa na-akpa,
site nʼaka ndị ajọ omume. 14Ihe a bụrụ ọnụ ka ụbọchị ahụ a mụrụ m bụ.
Ka ụbọchị nne m mụrụ m ghara inwe ngọzị. 15Onye a na-abụ ọnụ ka nwoke ahụ bụ nke wetara nna m akụkọ ọmụmụ m,
nke mere ka ọ ṅụrịa ọṅụ, na-asị ya,
“A mụọlara gị nwa, ọ bụ nwa nwoke!”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.