Native Bible

Jeremiah 20:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onye a na-abụ ọnụ ka nwoke ahụ bụ nke wetara nna m akụkọ ọmụmụ m, nke mere ka ọ ṅụrịa ọṅụ, na-asị ya, “A mụọlara gị nwa, ọ bụ nwa nwoke!”

Jeremiah 20:15 in English

Jeremiah 20:15 · Berean Standard Bible

Cursed be the man who brought my father the news, saying, “A son is born to you,” bringing him great joy.

Context

13Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ! Nyenụ Onyenwe anyị otuto! Nʼihi na ọ na-anapụta ndụ ndị mkpa na-akpa, site nʼaka ndị ajọ omume. 14Ihe a bụrụ ọnụ ka ụbọchị ahụ a mụrụ m bụ. Ka ụbọchị nne m mụrụ m ghara inwe ngọzị. 15Onye a na-abụ ọnụ ka nwoke ahụ bụ nke wetara nna m akụkọ ọmụmụ m, nke mere ka ọ ṅụrịa ọṅụ, na-asị ya, “A mụọlara gị nwa, ọ bụ nwa nwoke!” 16Ka e meekwa nwoke ahụ ihe Onyenwe anyị mere obodo ndị ahụ o bibiri na-enweghị ọmịiko. Ka nwoke ahụ nọgidekwa na-anụ iti mkpu akwa nʼụtụtụ, na akwa ibu agha nʼehihie. 17Nʼihi na ọ hapụrụ igbu m mgbe m nọ nʼafọ nne m, hapụ ime ka afọ nne m bụrụ ili m, ka afọ ya bụrụkwa ihe buru ibu ruo mgbe ebighị ebi.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.