Jeremaya 20:16
Jeremiah 20:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ka e meekwa nwoke ahụ ihe Onyenwe anyị mere obodo ndị ahụ o bibiri na-enweghị ọmịiko. Ka nwoke ahụ nọgidekwa na-anụ iti mkpu akwa nʼụtụtụ, na akwa ibu agha nʼehihie.
Jeremiah 20:16 in English
Jeremiah 20:16 · Berean Standard Bible
May that man be like the cities that the LORD overthrew without compassion. May he hear an outcry in the morning and a battle cry at noon,
Context
14Ihe a bụrụ ọnụ ka ụbọchị ahụ a mụrụ m bụ.
Ka ụbọchị nne m mụrụ m ghara inwe ngọzị. 15Onye a na-abụ ọnụ ka nwoke ahụ bụ nke wetara nna m akụkọ ọmụmụ m,
nke mere ka ọ ṅụrịa ọṅụ, na-asị ya,
“A mụọlara gị nwa, ọ bụ nwa nwoke!” 16Ka e meekwa nwoke ahụ ihe Onyenwe anyị mere obodo ndị ahụ
o bibiri na-enweghị ọmịiko.
Ka nwoke ahụ nọgidekwa na-anụ iti mkpu akwa nʼụtụtụ,
na akwa ibu agha nʼehihie. 17Nʼihi na ọ hapụrụ igbu m mgbe m nọ nʼafọ nne m,
hapụ ime ka afọ nne m bụrụ ili m,
ka afọ ya bụrụkwa ihe buru ibu ruo mgbe ebighị ebi. 18Nʼihi gịnị ka m ji site nʼafọ nne m pụta
ịhụ ọnọdụ ọjọọ ndị a, na ịnọgide nʼobi mwute,
na ịnọ ọnọdụ ihere ogologo ụbọchị niile nke ndụ m?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.