Jeremaya 20:18
Jeremiah 20:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi gịnị ka m ji site nʼafọ nne m pụta ịhụ ọnọdụ ọjọọ ndị a, na ịnọgide nʼobi mwute, na ịnọ ọnọdụ ihere ogologo ụbọchị niile nke ndụ m?
Jeremiah 20:18 in English
Jeremiah 20:18 · Berean Standard Bible
Why did I come out of the womb to see only trouble and sorrow, and to end my days in shame?
Context
16Ka e meekwa nwoke ahụ ihe Onyenwe anyị mere obodo ndị ahụ
o bibiri na-enweghị ọmịiko.
Ka nwoke ahụ nọgidekwa na-anụ iti mkpu akwa nʼụtụtụ,
na akwa ibu agha nʼehihie. 17Nʼihi na ọ hapụrụ igbu m mgbe m nọ nʼafọ nne m,
hapụ ime ka afọ nne m bụrụ ili m,
ka afọ ya bụrụkwa ihe buru ibu ruo mgbe ebighị ebi. 18Nʼihi gịnị ka m ji site nʼafọ nne m pụta
ịhụ ọnọdụ ọjọọ ndị a, na ịnọgide nʼobi mwute,
na ịnọ ọnọdụ ihere ogologo ụbọchị niile nke ndụ m?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.