Jeremaya 20:12
Jeremiah 20:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma gị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, gị, onye na-enyocha onye ezi omume, onye anya ya na-eru nʼihe dị mmadụ nʼobi na nʼime echiche uche ya, biko, kwere ka m dị ndụ hụ mgbe ị ga-abọrọ onwe gị ọbọ megide ha, nʼihi na ọ bụ nʼaka gị ka m tinyere ihe niile gbasara m.
Jeremiah 20:12 in English
Jeremiah 20:12 · Berean Standard Bible
O LORD of Hosts, who examines the righteous, who sees the heart * and mind, let me see Your vengeance upon them, for to You I have committed my cause.
Context
10Ana m anụ ọtụtụ akụkọ nzuzo,
“Oke egwu nʼakụkụ niile!
Jụụnụ ya! Ka anyị jụụnụ ya!”
Ndị enyi m niile
nọ na-eche mgbe m ga-azọhie ụkwụ daa, na-asị,
“Ma eleghị anya ọ ga-abụ onye eduhiere,
mgbe ahụ, anyị ga-emegide ya,
bọọrọ onwe anyị ọbọ nʼahụ ya.” 11Ma Onyenwe anyị nọnyeere m dịka dike nʼagha;
nʼihi ya, ndị na-esogbu m ga-asọ ngọngọ, ha agaghị emerikwa m.
Ihe ha zubere agaghị emezuru ha, nʼihi ya, ihere ga-eme ha nke ukwuu;
a gaghị echezọkwa ọnọdụ ihere ha ruo ebighị ebi. 12Ma gị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, gị, onye na-enyocha onye ezi omume,
onye anya ya na-eru nʼihe dị mmadụ nʼobi na nʼime echiche uche ya,
biko, kwere ka m dị ndụ hụ mgbe ị ga-abọrọ onwe gị ọbọ megide ha,
nʼihi na ọ bụ nʼaka gị ka m tinyere ihe niile gbasara m. 13Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ!
Nyenụ Onyenwe anyị otuto!
Nʼihi na ọ na-anapụta ndụ ndị mkpa na-akpa,
site nʼaka ndị ajọ omume. 14Ihe a bụrụ ọnụ ka ụbọchị ahụ a mụrụ m bụ.
Ka ụbọchị nne m mụrụ m ghara inwe ngọzị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.