Jeremaya 20:10
Jeremiah 20:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ana m anụ ọtụtụ akụkọ nzuzo, “Oke egwu nʼakụkụ niile! Jụụnụ ya! Ka anyị jụụnụ ya!” Ndị enyi m niile nọ na-eche mgbe m ga-azọhie ụkwụ daa, na-asị, “Ma eleghị anya ọ ga-abụ onye eduhiere, mgbe ahụ, anyị ga-emegide ya, bọọrọ onwe anyị ọbọ nʼahụ ya.”
Jeremiah 20:10 in English
Jeremiah 20:10 · Berean Standard Bible
For I have heard the whispering of many: “Terror is on every side! Report him; let us report him!” All my trusted friends watch for my fall: “Perhaps he will be deceived so that we may prevail against him and take our vengeance upon him.”
Context
8Nʼihi na mgbe ọbụla m meghere ọnụ kwuo okwu, aghaghị m iti mkpu.
Aga m akpọ mkpu banyere ihe ike na ịla nʼiyi.
Nʼihi na okwu Onyenwe anyị ewetarala
m mkparị na ịkwa emo ụbọchị niile. 9Ọ bụrụkwa na m ekwuo nʼobi m sị, “Agaghị m ekwute ihe ọbụla metụtara okwu ya maọbụ aha ya ọzọ.”
Ọ dịghị ekwe m.
Nʼihi na okwu ya na-enwu m ọkụ nʼobi.
Ọ dịkwa ka ọkụ na-enwu enwu emechibidoro ụzọ nʼime ọkpụkpụ m.
Ike agwụla m ịnagide okpomọkụ nke okwu ya.
Nʼezie, apụghịkwa m ịnagide ya. 10Ana m anụ ọtụtụ akụkọ nzuzo,
“Oke egwu nʼakụkụ niile!
Jụụnụ ya! Ka anyị jụụnụ ya!”
Ndị enyi m niile
nọ na-eche mgbe m ga-azọhie ụkwụ daa, na-asị,
“Ma eleghị anya ọ ga-abụ onye eduhiere,
mgbe ahụ, anyị ga-emegide ya,
bọọrọ onwe anyị ọbọ nʼahụ ya.” 11Ma Onyenwe anyị nọnyeere m dịka dike nʼagha;
nʼihi ya, ndị na-esogbu m ga-asọ ngọngọ, ha agaghị emerikwa m.
Ihe ha zubere agaghị emezuru ha, nʼihi ya, ihere ga-eme ha nke ukwuu;
a gaghị echezọkwa ọnọdụ ihere ha ruo ebighị ebi. 12Ma gị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, gị, onye na-enyocha onye ezi omume,
onye anya ya na-eru nʼihe dị mmadụ nʼobi na nʼime echiche uche ya,
biko, kwere ka m dị ndụ hụ mgbe ị ga-abọrọ onwe gị ọbọ megide ha,
nʼihi na ọ bụ nʼaka gị ka m tinyere ihe niile gbasara m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.