Jeremaya 20:9
Jeremiah 20:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụrụkwa na m ekwuo nʼobi m sị, “Agaghị m ekwute ihe ọbụla metụtara okwu ya maọbụ aha ya ọzọ.” Ọ dịghị ekwe m. Nʼihi na okwu ya na-enwu m ọkụ nʼobi. Ọ dịkwa ka ọkụ na-enwu enwu emechibidoro ụzọ nʼime ọkpụkpụ m. Ike agwụla m ịnagide okpomọkụ nke okwu ya. Nʼezie, apụghịkwa m ịnagide ya.
Jeremiah 20:9 in English
Jeremiah 20:9 · Berean Standard Bible
If I say, “I will not mention Him or speak any more in His name,” His message becomes a fire burning in my heart, shut up in my bones, and I become weary of holding it in, and I cannot prevail.
Context
7Onyenwe anyị, ị ghọọla m aghụghọ, meekwa m ka m ghọọ onye a ghọgburu nʼaghụghọ.
I jidesiela m aka ike, mee ka uche gị mezuo m nʼahụ.
Lee na mmadụ niile na-akparị m ụbọchị niile.
Onye ọbụla jikwa m na-eme ihe ọchị. 8Nʼihi na mgbe ọbụla m meghere ọnụ kwuo okwu, aghaghị m iti mkpu.
Aga m akpọ mkpu banyere ihe ike na ịla nʼiyi.
Nʼihi na okwu Onyenwe anyị ewetarala
m mkparị na ịkwa emo ụbọchị niile. 9Ọ bụrụkwa na m ekwuo nʼobi m sị, “Agaghị m ekwute ihe ọbụla metụtara okwu ya maọbụ aha ya ọzọ.”
Ọ dịghị ekwe m.
Nʼihi na okwu ya na-enwu m ọkụ nʼobi.
Ọ dịkwa ka ọkụ na-enwu enwu emechibidoro ụzọ nʼime ọkpụkpụ m.
Ike agwụla m ịnagide okpomọkụ nke okwu ya.
Nʼezie, apụghịkwa m ịnagide ya. 10Ana m anụ ọtụtụ akụkọ nzuzo,
“Oke egwu nʼakụkụ niile!
Jụụnụ ya! Ka anyị jụụnụ ya!”
Ndị enyi m niile
nọ na-eche mgbe m ga-azọhie ụkwụ daa, na-asị,
“Ma eleghị anya ọ ga-abụ onye eduhiere,
mgbe ahụ, anyị ga-emegide ya,
bọọrọ onwe anyị ọbọ nʼahụ ya.” 11Ma Onyenwe anyị nọnyeere m dịka dike nʼagha;
nʼihi ya, ndị na-esogbu m ga-asọ ngọngọ, ha agaghị emerikwa m.
Ihe ha zubere agaghị emezuru ha, nʼihi ya, ihere ga-eme ha nke ukwuu;
a gaghị echezọkwa ọnọdụ ihere ha ruo ebighị ebi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.