Native Bible

Jeremiah 20:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na mgbe ọbụla m meghere ọnụ kwuo okwu, aghaghị m iti mkpu. Aga m akpọ mkpu banyere ihe ike na ịla nʼiyi. Nʼihi na okwu Onyenwe anyị ewetarala m mkparị na ịkwa emo ụbọchị niile.

Jeremiah 20:8 in English

Jeremiah 20:8 · Berean Standard Bible

For whenever I speak, I cry out; I proclaim violence and destruction. For the word of the LORD has become to me a reproach and derision all day long.

Context

6Ma gị onwe gị bụ Pashua, na ndị niile bi nʼụlọ gị, ka a ga-adọta nʼagha buru gaa Babilọn. Nʼebe ahụ ka ị ga-anwụ. Ebe ahụ kwa ka a ga-eli gị, gị na ndị enyi gị ndị a niile ị na-eburu amụma ụgha.’ ” 7Onyenwe anyị, ị ghọọla m aghụghọ, meekwa m ka m ghọọ onye a ghọgburu nʼaghụghọ. I jidesiela m aka ike, mee ka uche gị mezuo m nʼahụ. Lee na mmadụ niile na-akparị m ụbọchị niile. Onye ọbụla jikwa m na-eme ihe ọchị. 8Nʼihi na mgbe ọbụla m meghere ọnụ kwuo okwu, aghaghị m iti mkpu. Aga m akpọ mkpu banyere ihe ike na ịla nʼiyi. Nʼihi na okwu Onyenwe anyị ewetarala m mkparị na ịkwa emo ụbọchị niile. 9Ọ bụrụkwa na m ekwuo nʼobi m sị, “Agaghị m ekwute ihe ọbụla metụtara okwu ya maọbụ aha ya ọzọ.” Ọ dịghị ekwe m. Nʼihi na okwu ya na-enwu m ọkụ nʼobi. Ọ dịkwa ka ọkụ na-enwu enwu emechibidoro ụzọ nʼime ọkpụkpụ m. Ike agwụla m ịnagide okpomọkụ nke okwu ya. Nʼezie, apụghịkwa m ịnagide ya. 10Ana m anụ ọtụtụ akụkọ nzuzo, “Oke egwu nʼakụkụ niile! Jụụnụ ya! Ka anyị jụụnụ ya!” Ndị enyi m niile nọ na-eche mgbe m ga-azọhie ụkwụ daa, na-asị, “Ma eleghị anya ọ ga-abụ onye eduhiere, mgbe ahụ, anyị ga-emegide ya, bọọrọ onwe anyị ọbọ nʼahụ ya.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.