Jeremaya 20:8
Jeremiah 20:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na mgbe ọbụla m meghere ọnụ kwuo okwu, aghaghị m iti mkpu. Aga m akpọ mkpu banyere ihe ike na ịla nʼiyi. Nʼihi na okwu Onyenwe anyị ewetarala m mkparị na ịkwa emo ụbọchị niile.
Jeremiah 20:8 in English
Jeremiah 20:8 · Berean Standard Bible
For whenever I speak, I cry out; I proclaim violence and destruction. For the word of the LORD has become to me a reproach and derision all day long.
Context
6Ma gị onwe gị bụ Pashua, na ndị niile bi nʼụlọ gị, ka a ga-adọta nʼagha buru gaa Babilọn. Nʼebe ahụ ka ị ga-anwụ. Ebe ahụ kwa ka a ga-eli gị, gị na ndị enyi gị ndị a niile ị na-eburu amụma ụgha.’ ” 7Onyenwe anyị, ị ghọọla m aghụghọ, meekwa m ka m ghọọ onye a ghọgburu nʼaghụghọ.
I jidesiela m aka ike, mee ka uche gị mezuo m nʼahụ.
Lee na mmadụ niile na-akparị m ụbọchị niile.
Onye ọbụla jikwa m na-eme ihe ọchị. 8Nʼihi na mgbe ọbụla m meghere ọnụ kwuo okwu, aghaghị m iti mkpu.
Aga m akpọ mkpu banyere ihe ike na ịla nʼiyi.
Nʼihi na okwu Onyenwe anyị ewetarala
m mkparị na ịkwa emo ụbọchị niile. 9Ọ bụrụkwa na m ekwuo nʼobi m sị, “Agaghị m ekwute ihe ọbụla metụtara okwu ya maọbụ aha ya ọzọ.”
Ọ dịghị ekwe m.
Nʼihi na okwu ya na-enwu m ọkụ nʼobi.
Ọ dịkwa ka ọkụ na-enwu enwu emechibidoro ụzọ nʼime ọkpụkpụ m.
Ike agwụla m ịnagide okpomọkụ nke okwu ya.
Nʼezie, apụghịkwa m ịnagide ya. 10Ana m anụ ọtụtụ akụkọ nzuzo,
“Oke egwu nʼakụkụ niile!
Jụụnụ ya! Ka anyị jụụnụ ya!”
Ndị enyi m niile
nọ na-eche mgbe m ga-azọhie ụkwụ daa, na-asị,
“Ma eleghị anya ọ ga-abụ onye eduhiere,
mgbe ahụ, anyị ga-emegide ya,
bọọrọ onwe anyị ọbọ nʼahụ ya.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.