Jeremaya 20:7
Jeremiah 20:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị, ị ghọọla m aghụghọ, meekwa m ka m ghọọ onye a ghọgburu nʼaghụghọ. I jidesiela m aka ike, mee ka uche gị mezuo m nʼahụ. Lee na mmadụ niile na-akparị m ụbọchị niile. Onye ọbụla jikwa m na-eme ihe ọchị.
Jeremiah 20:7 in English
Jeremiah 20:7 · Berean Standard Bible
You have deceived me, O LORD, and I was deceived. You have overcome me and prevailed. I am a laughingstock all day long; everyone mocks me.
Context
5Aga m enyefe ndị iro ha akụ niile dị nʼobodo, na ihe niile ha rụpụtara, na ihe niile dị oke ọnụahịa, na ngwongwo na akụ niile nke ndị eze Juda. Ha ga-eburu ya dịka ihe a kwatara nʼagha laa Babilọn. 6Ma gị onwe gị bụ Pashua, na ndị niile bi nʼụlọ gị, ka a ga-adọta nʼagha buru gaa Babilọn. Nʼebe ahụ ka ị ga-anwụ. Ebe ahụ kwa ka a ga-eli gị, gị na ndị enyi gị ndị a niile ị na-eburu amụma ụgha.’ ” 7Onyenwe anyị, ị ghọọla m aghụghọ, meekwa m ka m ghọọ onye a ghọgburu nʼaghụghọ.
I jidesiela m aka ike, mee ka uche gị mezuo m nʼahụ.
Lee na mmadụ niile na-akparị m ụbọchị niile.
Onye ọbụla jikwa m na-eme ihe ọchị. 8Nʼihi na mgbe ọbụla m meghere ọnụ kwuo okwu, aghaghị m iti mkpu.
Aga m akpọ mkpu banyere ihe ike na ịla nʼiyi.
Nʼihi na okwu Onyenwe anyị ewetarala
m mkparị na ịkwa emo ụbọchị niile. 9Ọ bụrụkwa na m ekwuo nʼobi m sị, “Agaghị m ekwute ihe ọbụla metụtara okwu ya maọbụ aha ya ọzọ.”
Ọ dịghị ekwe m.
Nʼihi na okwu ya na-enwu m ọkụ nʼobi.
Ọ dịkwa ka ọkụ na-enwu enwu emechibidoro ụzọ nʼime ọkpụkpụ m.
Ike agwụla m ịnagide okpomọkụ nke okwu ya.
Nʼezie, apụghịkwa m ịnagide ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.