Jeremaya 2:18
Jeremiah 2:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ugbu a, gịnị bụ uru unu nwetara site nʼịga Ijipt sitekwa nʼịṅụ mmiri nke osimiri Naịl? Gịnị bụ uru unu nwetara site nʼịga Asịrịa, sitekwa nʼịṅụ mmiri si na Yufretis?
Jeremiah 2:18 in English
Jeremiah 2:18 · Berean Standard Bible
Now what will you gain on your way to Egypt to drink the waters of the Nile *? What will you gain on your way to Assyria to drink the waters of the Euphrates *?
Context
16Ọzọkwa, ndị ikom Memfis na Tapanhis
a kupuola gị isi. 17Ọ bụghị unu onwe unu wetaara onwe unu ihe ọjọọ dị otu a
site na ịhapụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu,
mgbe ọ na-edu unu na-aga nʼụzọ? 18Ugbu a, gịnị bụ uru unu nwetara site nʼịga Ijipt
sitekwa nʼịṅụ mmiri nke osimiri Naịl?
Gịnị bụ uru unu nwetara site nʼịga Asịrịa,
sitekwa nʼịṅụ mmiri si na Yufretis? 19Ọ bụ ajọ omume unu ga-ewetara unu ahụhụ;
ahụhụ soo ndaghachi azụ unu bụ ihe ga-adọ unu aka na ntị.
Tulee ma matanụ nʼonwe unu
otu o si bụrụ ihe ọjọọ na ihe ilu nye unu
bụ inupu isi na ịgbakụta Onyenwe anyị bụ Chineke unu azụ
na-enweghị egwu ọbụla nʼime unu banyere m,”
nke a bụ ihe Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile, kwupụtara. 20“Nʼoge gara aga, unu gbajiri yoku unu
dọkapụ agbụ jikọtara mụ na unu,
unu sịrị, ‘Agaghị m ejere gị ozi.’
Nʼezie, ọ bụ nʼelu ugwu ọbụla
nakwa nʼokpuru osisi na-agbasa agbasa,
ka ị na-edina dịka onye akwụna.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.