Native Bible

Jeremiah 2:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụ ajọ omume unu ga-ewetara unu ahụhụ; ahụhụ soo ndaghachi azụ unu bụ ihe ga-adọ unu aka na ntị. Tulee ma matanụ nʼonwe unu otu o si bụrụ ihe ọjọọ na ihe ilu nye unu bụ inupu isi na ịgbakụta Onyenwe anyị bụ Chineke unu azụ na-enweghị egwu ọbụla nʼime unu banyere m,” nke a bụ ihe Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile, kwupụtara.

Jeremiah 2:19 in English

Jeremiah 2:19 · Berean Standard Bible

Your own evil will discipline you; your own apostasies will reprimand you. Consider and realize how evil and bitter it is for you to forsake the LORD your God and to have no fear of Me,” declares the Lord GOD of Hosts.

Context

17Ọ bụghị unu onwe unu wetaara onwe unu ihe ọjọọ dị otu a site na ịhapụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu, mgbe ọ na-edu unu na-aga nʼụzọ? 18Ugbu a, gịnị bụ uru unu nwetara site nʼịga Ijipt sitekwa nʼịṅụ mmiri nke osimiri Naịl? Gịnị bụ uru unu nwetara site nʼịga Asịrịa, sitekwa nʼịṅụ mmiri si na Yufretis? 19Ọ bụ ajọ omume unu ga-ewetara unu ahụhụ; ahụhụ soo ndaghachi azụ unu bụ ihe ga-adọ unu aka na ntị. Tulee ma matanụ nʼonwe unu otu o si bụrụ ihe ọjọọ na ihe ilu nye unu bụ inupu isi na ịgbakụta Onyenwe anyị bụ Chineke unu azụ na-enweghị egwu ọbụla nʼime unu banyere m,” nke a bụ ihe Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile, kwupụtara. 20“Nʼoge gara aga, unu gbajiri yoku unu dọkapụ agbụ jikọtara mụ na unu, unu sịrị, ‘Agaghị m ejere gị ozi.’ Nʼezie, ọ bụ nʼelu ugwu ọbụla nakwa nʼokpuru osisi na-agbasa agbasa, ka ị na-edina dịka onye akwụna. 21Ma mụ onwe m kụrụ gị dịka osisi vaịnị kachasị mma nke mkpụrụ ya dị ndụ dịkwa mma. Olee otu i siri tụgharịa megide m, ghọọ ihe rụrụ arụ, osisi vaịnị ọhịa?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.