Jeremaya 2:21
Jeremiah 2:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma mụ onwe m kụrụ gị dịka osisi vaịnị kachasị mma nke mkpụrụ ya dị ndụ dịkwa mma. Olee otu i siri tụgharịa megide m, ghọọ ihe rụrụ arụ, osisi vaịnị ọhịa?
Jeremiah 2:21 in English
Jeremiah 2:21 · Berean Standard Bible
I had planted you like a choice vine from the very best seed. How could you turn yourself before Me into a rotten, wild vine?
Context
19Ọ bụ ajọ omume unu ga-ewetara unu ahụhụ;
ahụhụ soo ndaghachi azụ unu bụ ihe ga-adọ unu aka na ntị.
Tulee ma matanụ nʼonwe unu
otu o si bụrụ ihe ọjọọ na ihe ilu nye unu
bụ inupu isi na ịgbakụta Onyenwe anyị bụ Chineke unu azụ
na-enweghị egwu ọbụla nʼime unu banyere m,”
nke a bụ ihe Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile, kwupụtara. 20“Nʼoge gara aga, unu gbajiri yoku unu
dọkapụ agbụ jikọtara mụ na unu,
unu sịrị, ‘Agaghị m ejere gị ozi.’
Nʼezie, ọ bụ nʼelu ugwu ọbụla
nakwa nʼokpuru osisi na-agbasa agbasa,
ka ị na-edina dịka onye akwụna. 21Ma mụ onwe m kụrụ gị dịka osisi vaịnị kachasị mma
nke mkpụrụ ya dị ndụ dịkwa mma.
Olee otu i siri tụgharịa megide m,
ghọọ ihe rụrụ arụ, osisi vaịnị ọhịa? 22Nʼagbanyeghị na iji ncha* sachaa onwe gị,
maọbụ jirikwa ọtụtụ ntụ ncha,
ntụpọ nke mmehie gị ka dị nʼihu m,”
Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara. 23“Ị ga-esi aṅaa na-asị, ‘A bụghị m onye e merụrụ emerụ;
o nwebeghị oge ọbụla m ji gbaso Baal?’
Leruo ụzọ gị anya na ndagwurugwu,
tulee ihe ndị i mere.
Ị bụ nne ịnyịnya ibu dị nkọ,
na-agbagharị ebe a nʼebe nke ọzọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.