Jeremaya 2:20
Jeremiah 2:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nʼoge gara aga, unu gbajiri yoku unu dọkapụ agbụ jikọtara mụ na unu, unu sịrị, ‘Agaghị m ejere gị ozi.’ Nʼezie, ọ bụ nʼelu ugwu ọbụla nakwa nʼokpuru osisi na-agbasa agbasa, ka ị na-edina dịka onye akwụna.
Jeremiah 2:20 in English
Jeremiah 2:20 · Berean Standard Bible
“For long ago you broke your yoke and tore off your chains, saying, ‘I will not serve!’ Indeed, on every high hill and under every green tree you lay down as a prostitute.
Context
18Ugbu a, gịnị bụ uru unu nwetara site nʼịga Ijipt
sitekwa nʼịṅụ mmiri nke osimiri Naịl?
Gịnị bụ uru unu nwetara site nʼịga Asịrịa,
sitekwa nʼịṅụ mmiri si na Yufretis? 19Ọ bụ ajọ omume unu ga-ewetara unu ahụhụ;
ahụhụ soo ndaghachi azụ unu bụ ihe ga-adọ unu aka na ntị.
Tulee ma matanụ nʼonwe unu
otu o si bụrụ ihe ọjọọ na ihe ilu nye unu
bụ inupu isi na ịgbakụta Onyenwe anyị bụ Chineke unu azụ
na-enweghị egwu ọbụla nʼime unu banyere m,”
nke a bụ ihe Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile, kwupụtara. 20“Nʼoge gara aga, unu gbajiri yoku unu
dọkapụ agbụ jikọtara mụ na unu,
unu sịrị, ‘Agaghị m ejere gị ozi.’
Nʼezie, ọ bụ nʼelu ugwu ọbụla
nakwa nʼokpuru osisi na-agbasa agbasa,
ka ị na-edina dịka onye akwụna. 21Ma mụ onwe m kụrụ gị dịka osisi vaịnị kachasị mma
nke mkpụrụ ya dị ndụ dịkwa mma.
Olee otu i siri tụgharịa megide m,
ghọọ ihe rụrụ arụ, osisi vaịnị ọhịa? 22Nʼagbanyeghị na iji ncha* sachaa onwe gị,
maọbụ jirikwa ọtụtụ ntụ ncha,
ntụpọ nke mmehie gị ka dị nʼihu m,”
Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.