Native Bible

Jeremiah 2:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼagbanyeghị na iji ncha* sachaa onwe gị, maọbụ jirikwa ọtụtụ ntụ ncha, ntụpọ nke mmehie gị ka dị nʼihu m,” Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara.

Jeremiah 2:22 in English

Jeremiah 2:22 · Berean Standard Bible

Although you wash with lye and use an abundance of soap, the stain of your guilt is still before Me,” declares the Lord GOD.

Context

20“Nʼoge gara aga, unu gbajiri yoku unu dọkapụ agbụ jikọtara mụ na unu, unu sịrị, ‘Agaghị m ejere gị ozi.’ Nʼezie, ọ bụ nʼelu ugwu ọbụla nakwa nʼokpuru osisi na-agbasa agbasa, ka ị na-edina dịka onye akwụna. 21Ma mụ onwe m kụrụ gị dịka osisi vaịnị kachasị mma nke mkpụrụ ya dị ndụ dịkwa mma. Olee otu i siri tụgharịa megide m, ghọọ ihe rụrụ arụ, osisi vaịnị ọhịa? 22Nʼagbanyeghị na iji ncha* sachaa onwe gị, maọbụ jirikwa ọtụtụ ntụ ncha, ntụpọ nke mmehie gị ka dị nʼihu m,” Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara. 23“Ị ga-esi aṅaa na-asị, ‘A bụghị m onye e merụrụ emerụ; o nwebeghị oge ọbụla m ji gbaso Baal?’ Leruo ụzọ gị anya na ndagwurugwu, tulee ihe ndị i mere. Ị bụ nne ịnyịnya ibu dị nkọ, na-agbagharị ebe a nʼebe nke ọzọ. 24Nne ịnyịnya ibu ọhịa nke mara ụzọ ya nke ọma nʼọzara, na-esi imi ma ọ ga-esichapụta oke ịnyịnya ibu, onye pụrụ igbochi ya nʼoge mmekọ ya na oke ịnyịnya zuru? Oke ịnyịnya ọbụla chọọrọ ya agaghị atụfu oge nʼịchụgharị ya, nʼihi nʼoge ha chọrọ mmekọ, ha ga-achọta ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.