Jeremaya 2:23
Jeremiah 2:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ị ga-esi aṅaa na-asị, ‘A bụghị m onye e merụrụ emerụ; o nwebeghị oge ọbụla m ji gbaso Baal?’ Leruo ụzọ gị anya na ndagwurugwu, tulee ihe ndị i mere. Ị bụ nne ịnyịnya ibu dị nkọ, na-agbagharị ebe a nʼebe nke ọzọ.
Jeremiah 2:23 in English
Jeremiah 2:23 · Berean Standard Bible
“How can you say, ‘I am not defiled; I have not run after the Baals’? Look at your behavior in the valley; acknowledge what you have done. You are a swift young she-camel galloping here and there,
Context
21Ma mụ onwe m kụrụ gị dịka osisi vaịnị kachasị mma
nke mkpụrụ ya dị ndụ dịkwa mma.
Olee otu i siri tụgharịa megide m,
ghọọ ihe rụrụ arụ, osisi vaịnị ọhịa? 22Nʼagbanyeghị na iji ncha* sachaa onwe gị,
maọbụ jirikwa ọtụtụ ntụ ncha,
ntụpọ nke mmehie gị ka dị nʼihu m,”
Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara. 23“Ị ga-esi aṅaa na-asị, ‘A bụghị m onye e merụrụ emerụ;
o nwebeghị oge ọbụla m ji gbaso Baal?’
Leruo ụzọ gị anya na ndagwurugwu,
tulee ihe ndị i mere.
Ị bụ nne ịnyịnya ibu dị nkọ,
na-agbagharị ebe a nʼebe nke ọzọ. 24Nne ịnyịnya ibu ọhịa nke mara ụzọ ya nke ọma nʼọzara,
na-esi imi ma ọ ga-esichapụta oke ịnyịnya ibu,
onye pụrụ igbochi ya nʼoge mmekọ ya na oke ịnyịnya zuru?
Oke ịnyịnya ọbụla chọọrọ ya agaghị atụfu oge nʼịchụgharị ya,
nʼihi nʼoge ha chọrọ mmekọ, ha ga-achọta ya. 25Agbala ọsọ ruo mgbe ị ga-agbara ụkwụ efu,
mgbe akpịrị ga-akpọ gị nku.
Ma ị na-asị, ‘O nweghị uru ọ bara.
Nʼihi na ahụrụ m chi ndị mba ọzọ nʼanya,
aghaghị m ịgbaso ha.’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.