Jeremaya 2:17
Jeremiah 2:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụghị unu onwe unu wetaara onwe unu ihe ọjọọ dị otu a site na ịhapụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu, mgbe ọ na-edu unu na-aga nʼụzọ?
Jeremiah 2:17 in English
Jeremiah 2:17 · Berean Standard Bible
Have you not brought this on yourself by forsaking the LORD your God when He led you in the way?
Context
15Ọdụm agbọọla ụja,
ha ebigbọọla meekwa ka ọ nụ olu ha.
Ha ebibiela obodo ya laa ya nʼiyi,
suo ya ọkụ, nke mere na o nweghị onye bi na ha. 16Ọzọkwa, ndị ikom Memfis na Tapanhis
a kupuola gị isi. 17Ọ bụghị unu onwe unu wetaara onwe unu ihe ọjọọ dị otu a
site na ịhapụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu,
mgbe ọ na-edu unu na-aga nʼụzọ? 18Ugbu a, gịnị bụ uru unu nwetara site nʼịga Ijipt
sitekwa nʼịṅụ mmiri nke osimiri Naịl?
Gịnị bụ uru unu nwetara site nʼịga Asịrịa,
sitekwa nʼịṅụ mmiri si na Yufretis? 19Ọ bụ ajọ omume unu ga-ewetara unu ahụhụ;
ahụhụ soo ndaghachi azụ unu bụ ihe ga-adọ unu aka na ntị.
Tulee ma matanụ nʼonwe unu
otu o si bụrụ ihe ọjọọ na ihe ilu nye unu
bụ inupu isi na ịgbakụta Onyenwe anyị bụ Chineke unu azụ
na-enweghị egwu ọbụla nʼime unu banyere m,”
nke a bụ ihe Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile, kwupụtara.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.