Jeremaya 2:15
Jeremiah 2:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọdụm agbọọla ụja, ha ebigbọọla meekwa ka ọ nụ olu ha. Ha ebibiela obodo ya laa ya nʼiyi, suo ya ọkụ, nke mere na o nweghị onye bi na ha.
Jeremiah 2:15 in English
Jeremiah 2:15 · Berean Standard Bible
The young lions have roared at him; they have growled with a loud voice. They have laid waste his land; his cities lie in ruins, without inhabitant.
Context
13“Nʼihi na ndị m emeela ihe ọjọọ abụọ.
Ha agbakụtala m azụ,
bụ Isi iyi mmiri ndụ,
gwuoro onwe ha ebe ichebe mmiri
nke tipuru etipu na-enweghị ike ịnagide mmiri ọbụla. 14Izrel ọ bụ ohu, ka ọ bụ ohu a mụrụ nʼụlọ?
Gịnị mere o ji ghọọ ihe nlụta nʼagha? 15Ọdụm agbọọla ụja,
ha ebigbọọla meekwa ka ọ nụ olu ha.
Ha ebibiela obodo ya laa ya nʼiyi,
suo ya ọkụ, nke mere na o nweghị onye bi na ha. 16Ọzọkwa, ndị ikom Memfis na Tapanhis
a kupuola gị isi. 17Ọ bụghị unu onwe unu wetaara onwe unu ihe ọjọọ dị otu a
site na ịhapụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu,
mgbe ọ na-edu unu na-aga nʼụzọ?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.