Jeremaya 2:14
Jeremiah 2:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Izrel ọ bụ ohu, ka ọ bụ ohu a mụrụ nʼụlọ? Gịnị mere o ji ghọọ ihe nlụta nʼagha?
Jeremiah 2:14 in English
Jeremiah 2:14 · Berean Standard Bible
Is Israel a slave? Was he born into slavery? Why then has he become prey?
Context
12Ka ibubo nwụọ gị, gị eluigwe nʼihi nke a,
maa jijiji, tụọkwa oke ụjọ.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 13“Nʼihi na ndị m emeela ihe ọjọọ abụọ.
Ha agbakụtala m azụ,
bụ Isi iyi mmiri ndụ,
gwuoro onwe ha ebe ichebe mmiri
nke tipuru etipu na-enweghị ike ịnagide mmiri ọbụla. 14Izrel ọ bụ ohu, ka ọ bụ ohu a mụrụ nʼụlọ?
Gịnị mere o ji ghọọ ihe nlụta nʼagha? 15Ọdụm agbọọla ụja,
ha ebigbọọla meekwa ka ọ nụ olu ha.
Ha ebibiela obodo ya laa ya nʼiyi,
suo ya ọkụ, nke mere na o nweghị onye bi na ha. 16Ọzọkwa, ndị ikom Memfis na Tapanhis
a kupuola gị isi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.