Jeremaya 2:12
Jeremiah 2:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ka ibubo nwụọ gị, gị eluigwe nʼihi nke a, maa jijiji, tụọkwa oke ụjọ.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
Jeremiah 2:12 in English
Jeremiah 2:12 · Berean Standard Bible
Be stunned by this, O heavens; be shocked and utterly appalled,” declares the LORD.
Context
10Gafee nʼọnụ mmiri Saiprọs lee anya,
zie ozi gaa Keda ma leruo anya nke ọma,
ma ị ga-ahụ ihe ọbụla yiri nke a. 11O nwerela mba gbanwere chi ndị ha na-efe?
(Ọ bụ ezie na ha abụghị chi.)
Ma ndị m ewerela arụsị na-enweghị isi
gbanwere ebube ha.* 12Ka ibubo nwụọ gị, gị eluigwe nʼihi nke a,
maa jijiji, tụọkwa oke ụjọ.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 13“Nʼihi na ndị m emeela ihe ọjọọ abụọ.
Ha agbakụtala m azụ,
bụ Isi iyi mmiri ndụ,
gwuoro onwe ha ebe ichebe mmiri
nke tipuru etipu na-enweghị ike ịnagide mmiri ọbụla. 14Izrel ọ bụ ohu, ka ọ bụ ohu a mụrụ nʼụlọ?
Gịnị mere o ji ghọọ ihe nlụta nʼagha?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.