Jeremaya 2:10
Jeremiah 2:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gafee nʼọnụ mmiri Saiprọs lee anya, zie ozi gaa Keda ma leruo anya nke ọma, ma ị ga-ahụ ihe ọbụla yiri nke a.
Jeremiah 2:10 in English
Jeremiah 2:10 · Berean Standard Bible
Cross over to the coasts of Cyprus * and take a look; send to Kedar and consider carefully; see if there has ever been anything like this:
Context
8Ndị nchụaja ajụghị sị,
‘Olee ebe Onyenwe anyị nọ?’
Ndị ikpe ha amaghị m,
ndị na-achị ha mehiere megide m,
ndị amụma ha bụkwa aha Baal ka ha ji ebu amụma,
ha gbasooro ihe na-enweghị isi. 9“Nʼihi ya, aga m ebulite ebubo megide unu,”*
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
“M ga-ebulikwa ebubo megide ụmụ ụmụ unu. 10Gafee nʼọnụ mmiri Saiprọs lee anya,
zie ozi gaa Keda ma leruo anya nke ọma,
ma ị ga-ahụ ihe ọbụla yiri nke a. 11O nwerela mba gbanwere chi ndị ha na-efe?
(Ọ bụ ezie na ha abụghị chi.)
Ma ndị m ewerela arụsị na-enweghị isi
gbanwere ebube ha.* 12Ka ibubo nwụọ gị, gị eluigwe nʼihi nke a,
maa jijiji, tụọkwa oke ụjọ.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.