Jeremaya 2:11
Jeremiah 2:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O nwerela mba gbanwere chi ndị ha na-efe? (Ọ bụ ezie na ha abụghị chi.) Ma ndị m ewerela arụsị na-enweghị isi gbanwere ebube ha.*
Jeremiah 2:11 in English
Jeremiah 2:11 · Berean Standard Bible
Has a nation ever changed its gods, though they are no gods at all? Yet My people have exchanged their Glory * for useless idols.
Context
9“Nʼihi ya, aga m ebulite ebubo megide unu,”*
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
“M ga-ebulikwa ebubo megide ụmụ ụmụ unu. 10Gafee nʼọnụ mmiri Saiprọs lee anya,
zie ozi gaa Keda ma leruo anya nke ọma,
ma ị ga-ahụ ihe ọbụla yiri nke a. 11O nwerela mba gbanwere chi ndị ha na-efe?
(Ọ bụ ezie na ha abụghị chi.)
Ma ndị m ewerela arụsị na-enweghị isi
gbanwere ebube ha.* 12Ka ibubo nwụọ gị, gị eluigwe nʼihi nke a,
maa jijiji, tụọkwa oke ụjọ.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 13“Nʼihi na ndị m emeela ihe ọjọọ abụọ.
Ha agbakụtala m azụ,
bụ Isi iyi mmiri ndụ,
gwuoro onwe ha ebe ichebe mmiri
nke tipuru etipu na-enweghị ike ịnagide mmiri ọbụla.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.